Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI FILIPAI 1:12-26

NDI FILIPAI 1:12-26 IGBOB

Ma anamezube ka unu mara, umu-nnam, na, kama ihe ọzọ, ọnọdum emewo ka ozi ọma ga n'iru; ya mere ab͕um putara ìhè nime Kraist na Pritoriọm dum, ya na n'ebe ndi nile fọduru nọ; o me kwa ka ndi ka n'ọnu-ọgugu n'etiti umu-nna nime Onye-nwe-ayi nwebiga anya-ike ókè ikwu okwu Chineke nātughi egwu, ebe ha tukwasiworo obi site n'ab͕um. Ọ bu ezie na ufọdu nēkwusa Kraist-ayi ọbuná n'ihi ekworo na esem-okwu; ma ufọdu nēkwusa kwa Ya n'ihi na ọ di ha ezi nma: ndia nēme ya site n'ihunanya, ebe ha matara na edorom ka m'we gọpu ozi ọma: ma ndi ahu nēkwusa Kraist-ayi site n'ikpa-iche-iche, ọ bughi n'idi-ọcha-n'obi, ebe ha nēchè na ha gēwelirim nkpab͕u n'ab͕um. Gini kwa? ọ bu nání na n'uzọ ọ bula, ma ọ bu n'aghughọ ma-ọbu n'ezi-okwu, anēkwusa Kraist; nime nka ka m'nāṅuri kwa ọṅu, e, m'gāṅuri kwa ọṅu nime ya. N'ihi na amataram na nka gēme ka m'nwe nzọputa, site n'aririọ-unu na nnyezu nke Mọ nke Jisus Kraist, dika olile-anya siri ike na ntukwasi-obi nkem si di, na n'ihe ọ bula ọ dighi ihere gēmem, kama na agēme kwa ka Kraist di uku n'arum ub͕u a, otú ọ di mb͕e nile, ma ọ bu site na ndu, ma-ọbu site n'ọnwu, nime nkwuwa-okwu nile. N'ihi na n'ebe m'nọ idi ndu bu Kraist, inwu anwu bu kwa urù. Ma ọ buru na idi ndu n'anu-aru bu òkèm, nka bu nkpuru nke ọlum: ihe m'gārọputa kwa amaghi m. Ma anọm n'ebe di nkpà n'etiti ihe abua ndia, ebe agu ila na inọ n'ebe Kraist nọ nāgum; n'ihi na ọ kachasi nma nke-uku: ma inọgide n'anu-aru dikariri nkpà n'ihi unu. Ebe m'tukwasiworo obi m n'ihe a, amataram na m'gānọgide, nọgide kwa n'etiti unu nile, ime ka unu ga n'iru ṅu kwa ọṅù nke okwukwe; ka inya-isi-unu we babiga ókè nime Kraist Jisus n'arum site n'ọbibia m'gābiakute unu ọzọ.

Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara NDI FILIPAI 1:12-26