Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌNU-ỌGUGU 8

8
1Jehova we gwa Moses okwu, si, 2Gwa Eron okwu, si ya, Mb͕e i nēweli oriọna asa ahu, na ncherita-iru nke iru ihe-idọba-oriọna ka oriọna asa ahu gēnye ìhè. 3Eron we me otú a; na ncherita-iru nke iru ihe-idọba-oriọna ahu ka o weliri oriọna-ya nile, dika Jehova nyere Moses iwu. 4Nka bu otú emere ihe-idọba-oriọna ahu, ihe akpuru akpu nke ọla-edo ka ọ bu; rue ukwu-ala-ya, ru kwa okoko-ya nile, ihe akpuru akpu ka ọ bu: dika ihe-ile-anya ahu si di nke Jehova mere ka Moses hu, otú a ka o mere ihe-idọba-oriọna ahu.
5Jehova we gwa Moses okwu, si, 6Weputa ndi Livai n'etiti umu Israel, me ka ha di ọcha. 7Otú a ka i gēme ha, ime ka ha di ọcha: fesa ha miri nāsachapu nmehie, ka ha me kwa ka aguba gabiga n'anu-aru-ha nile, ka ha su kwa uwe-ha, me kwa onwe-ha ka ha di ọcha. 8Ka ha were kwa nwa-oke ehi, na onyinye-inata-iru-ọma-ya, bú utu ọka flour agwara manu, nwa-oke-ehi ọzọ ka i gēwere kwa iji chu àjà-nmehie. 9I gēme kwa ka ndi Livai biaru nso n'iru ulo-ikwū nzute: i gākpọkọta kwa nzukọ nile nke umu Israel: 10i gēme kwa ka ndi Livai biaru nso n'iru Jehova: umu Israel gēbikwasi ndi Livai aka-ha: 11Eron gēfé ndi Livai n'iru Jehova ibu àjà-ofufé sitere n'umu Israel, ka ha we buru ndi gēfè òfùfè nke Jehova. 12Ndi Livai gēbikwasi aka-ha n'isi oke-ehi abua ahu: gi me otù nime ha ka ọ buru àjà-nmehie, me ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku, ichuru Jehova, ikpuchiri ndi Livai nmehie-ha. 13I gēguzo ndi Livai n'iru Eron, na n'iru umu-ya ndikom, fé kwa ha ka ha buru àjà-ofufé ichuru Jehova. 14I gēkewaputa kwa ndi Livai n'etiti umu Israel, ndi Livai gābu kwa ihe M'nwere. 15Emesia ndi Livai gābà ifè ulo-ikwū nzute òfùfè: i gēme ka ha di ọcha, fé kwa ha ibu àjà-ofufé. 16N'ihi na ndi enyesiworom ha nile ka ha bu site n'etiti umu Israel; n'ọnọdu umu nile ọ bula meghere àkpà-nwa, bú umu eburu uzọ muru madu nile nke umu Israel, ka M'wereworo ha n'Onwem. 17N'ihi na Mu nwe umu nile eburu uzọ mu n'etiti umu Israel, ma n'etiti mmadu ma n'etiti anu-ulo: n'ubọchi m'tib͕uru umu nile eburu uzọ mu n'ala Ijipt ka M'doro ha nsọ nye Onwem. 18Ewerewokwam ndi Livai n'ọnọdu umu nile eburu uzọ mu n'etiti umu Israel. 19Ewerewom ndi Livai nye Eron, nye kwa umu-ya ndikom, dika ndi enyere enye, site n'etiti umu Israel, ifè òfùfè nke umu Israel n'ulo-ikwū nzute, na ikpuchiri umu Israel nmehie-ha: ka ihe-otiti we ghara idi n'etiti umu Israel, n'ibiaru-nso nke umu Israel nābiaru ebe nsọm. 20Moses, na Eron, na nzukọ nile nke umu Israel, we me ndi Livai otú a: dika ihe nile si di nke Jehova nyere Moses n'iwu bayere ndi Livai, otú a ka umu Israel mere ha. 21Ndi Livai we wepu nmehie n'onwe-ha, su uwe-ha; Eron we fé ha ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova; Eron we kpuchiere ha nmehie-ha ime ka ha di ọcha. 22Emesia ndi Livai we ba ifè òfùfè-ha n'ulo-ikwū nzute n'iru Eron, na n'iru umu-ya ndikom: dika Jehova nyere Moses iwu bayere ndi Livai, otú a ka ha mere ha.
23Jehova we gwa Moses okwu, si 24Nka bu nke ndi Livai nwere: site n'onye b͕ara orú arọ na ise we gaba n'iru ha gābà ibu agha n'òfùfè nke ulo-ikwū nzute: 25ma site n'onye b͕ara ọgu arọ abua na iri we gaba n'iru ha gēsi n'ibu-agha nke òfùfè ahu laghachi, ha agaghi-efè ọzọ; 26ma ha gēso umu-nne-ha je ozi n'ulo-ikwū nzute, idebe ihe-ndebe, ma ọ dighi òfùfè ha gēfè. Otú a ka i gēme ndi Livai n'ihe-ndebe-ha.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ỌNU-ỌGUGU 8: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye