Jehova we gwa Moses okwu, si, Nye umu Israel iwu, ka ha chupu n'ọmuma-ulo-ikwū onye-ekpenta ọ bula na onye ọ bula nwere orùrù, na onye ọ bula ruru árú site na madu nwuru anwu: ma nwoke ma nwayi, unu gāchupu ha, n'azu ọmuma-ulo-ikwū ka unu gāchupu ha je; ka ha we ghara imeru ọmuma-ulo-ikwū-ha, nke Mu onwem bi n'etiti ha. Umu Israel we me otú a, chupu ha je n'azu ọmuma-ulo-ikwū: dika Jehova gwara Moses okwu, otú a ka umu Israel mere. Jehova we gwa Moses okwu, si, Gwa umu Israel okwu, si, Nwoke ma-ọbu nwayi, mb͕e ha gēme ihe nime nmehie nile nke madu, imekpu ihe-nmekpu megide Jehova, ikpe ewe ma nkpuru-obi ahu; ha gēkwuputa kwa nmehie-ha nke ha meworo: ọ gēnyeghachi kwa ihe ikpe mara ya nime ya n'isi-ya, ọ bu kwa otù uzọ n'uzọ ise ya ka ọ gātukwasi ya, nye onye ahu ikpe mara ya bayere ya. Ma ọ buru na nwoke ahu enweghi onye-nb͕aputa nke ọ gēnyeghachi ihe ahu nke ikpe mara ya nime ya, ihe ahu ikpe mara ya nime ya nke anēnyeghachi Jehova, onye-nchu-àjà gēnwe ya; nāgughi ebulu nke nkpuchi-nmehie, nke agēji kpuchiri ya nmehie-ya. Ajà-nbuli ọ bula nke ihe nsọ nile nke umu Israel, nke ha nēweta nso onye-nchu-àjà, ọ bu ya gēnwe ya. Ihe nsọ nile nke nwoke ọ bula, o bu ya gēnwe ha; ihe nwoke ọ bula gēnye onye-nchu-àjà, ọ bu ya gēnwe ya.
Gụọ ỌNU-ỌGUGU 5
Geere nke a ntị ỌNU-ỌGUGU 5
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌNU-ỌGUGU 5:1-10
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị