Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌNU-ỌGUGU 28:1-15

ỌNU-ỌGUGU 28:1-15 IGBOB

Jehova we gwa Moses okwu, si, Nye umu Israel iwu, si ha, Onyinyem iji biaru nso, nrim iji chu àjà-ọkum nile, bú ihe ísì utọ nkem, unu gēlezi anya iweta ya nsom na mb͕e-ya akara àkà. I gāsi kwa ha, Nka bu àjà-ọku nke unu gēweta nso Jehova; umu-aturu abua nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè, kwa-ubọchi, ibu àjà-nsure-oku anēsure mb͕e dum. Otù nime umu-aturu ahu ka i gāchu n'ututu, chu kwa nwa-aturu nke-ọzọ n'etiti ehihie na anyasi; na otù uzọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour agwara n'otù uzọ n'uzọ anọ nke otù hin nke manu asuru asu ka ọ buru onyinye-inata-iru-oma. Ọ bu àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, nke emere n'ugwu Sainai ka ọ buru ihe ísì utọ, bú àjà-ọku anāchuru Jehova. Àjà-ihe-ọṅuṅu-ya kwa, otú uzọ n'uzọ anọ nke otù hin gādiri otù nwa-aturu ahu: n'ebe nsọm ka i gāwusiri Jehova àjà-ihe-ọṅuṅu nke ihe-ọṅuṅu nāba n'anya. Nwa-aturu nke-ọzọ ka i gāchu kwa n'etiti ehihie na anyasi: dika onyinye-inata-iru-ọma enyere n'ututu, na dika àjà-ihe-ọṅuṅu-ya, otú a ka i gēme ya, ibu àjà-ọku nke ihe ísì utọ anēsurere jehova. N'ubọchi-izu-ike kwa: umu-aturu abua nke b͕ara otú arọ, nke zuru oké, na uzọ abua n'uzọ iri nke otú ephah utu ọka flour ibu onyinye-inata-iru-oma, nke agwara manu, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya: nka bu àjà-nsure-ọku ubọchi-izu-ike kwa-ubọchi-izu-ike, tiyere àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya. Ọzọ, na nmalite ọnwa-unu nile unu gēweta nso àjà-nsure-ọku isurere Jehova; umu-oke-ehi abua, na otù ebulu, na umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ, nke zuru okè; na uzọ atọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour, bú onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, iji chu oke-ehi ọ bula; na uzọ abua n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour, bú onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, iji chu otù ebulu; na otù uzọ n'uzọ iri, otù uzọ n'uzọ iri, nke otù ephah utu ọka flour, bú onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, iji chu nwa-aturu ọ bula; ọ bu àjà-nsure-ọku, ihe ísì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova. Àjà-ihe-ọṅuṅu-ha gābu kwa nkera otù hin manya-vine iji chu otú oke-ehi, na otú uzọ n'uzọ atọ nke hin iji chu ebulu ahu, na otù uzọ n'uzọ anọ nke hin iji chu otù nwa-aturu: nka bu àjà-nsure-ọku ọnwa kwa-ọnwa anēsure n'ọnwa nile nke arọ. Otù nkpi kwa iji chu àjà-nmehie nye Jehova; agāchu ya tiyere àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.