Jehova we si Moses, Kuru n'onwe-gi Joshua nwa Nun, bú nwoke nke Mọm di nime ya, bikwasi ya aka-gi; guzo kwa ya n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na n'iru nzukọm nile; nye ya iwu n'anya-ha. I gātukwasi kwa ya ufọdu nime ebube-gi, ka nzukọ nile nke umu Israel we nu. Ọ bu kwa n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, ka ọ gēguzo, onye gājuru ya ase n'ikpé Ìhe ahu n'iru Jehova: n'okwu-ọnu-ya ka ha ganāpu apu, ọ bu kwa n'okwu-ọnu-ya ka ha ganābà-abà, ya onwe-ya, na umu Israel nile tiyere ya, bú nzukọm nile. Moses we me dika Jehova nyere ya iwu: o we kuru Joshua, guzo ya n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na n'iru nzukọ Israel nile: o we bikwasi ya aka-ya abua, nye kwa ya iwu, dika Jehova kwuru n'aka Moses.
Gụọ ỌNU-ỌGUGU 27
Geere nke a ntị ỌNU-ỌGUGU 27
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌNU-ỌGUGU 27:18-23
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị