Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌNU-ỌGUGU 22:21-41

ỌNU-ỌGUGU 22:21-41 IGBOB

Belam we bilie n'ututu, jikwa nne-inyinya-ibu-ya soro ndi-isi Moab je. Iwe Chineke we di ọku n'ihi na ọ nēje: mọ-ozi nke Jehova we guzo onwe-ya n'uzọ ibu onye nēmegide ya. Ma ya onwe-ya nānọkwasi na nne-inyinya-ibu-ya, umu-okorọbia-ya abua so kwa ya. Nne-inyinya-ibu ahu we hu mọ-ozi nke Jehova ka o nēguzo n'uzọ, mma-agha-ya amiputara amiputa di kwa n'aka-ya: nne-inyinya-ibu ahu we wezuga onwe-ya n'uzọ, je n'ọhia: Belam we tie nne-inyinya-ibu ahu ihe, iwezuga ya ba n'uzọ. Mọ-ozi nke Jehova we guzo n'uzọ di warara n'etiti ubi-vine, ogige di n'otú akuku, ogige di kwa n'akuku nke-ọzọ. Nne-inyinya-ibu ahu we hu mọ-ozi nke Jehova, ọ we nuba onwe-ya na mb͕idi, nuba kwa ukwu Belam na mb͕idi ahu: o we tie ya ihe ọzọ. Mọ-ozi nke Jehova we gabiga ọzọ, guzo n'ebe di nkpa, ebe uzọ nādighi madu gēwezuga onwe-ya ga n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe. Nne-inyinya-ibu ahu we hu mọ-ozi nke Jehova, o we makpuru n'okpuru Belam: iwe Belam we di ọku, o were nkpa-n'aka-ya tie nne-inyinya-ibu ahu. Jehova we saghe ọnu nne-inyinya-ibu ahu, ọ we si Belam, Gini ka m'meworo gi, na itiwom ihe ub͕ò atọ ndia? Belam we si nne-inyinya-ibu ahu, N'ihi na i kwaram emò: ọ gādim nọ̄ nma ma asi na mma-agha di n'akam, n'ihi na ub͕u a m'gēb͕uwori gi. Nne-inyinya-ibu ahu we si Belam, Mù onwem abughi nne-inyinya-ibu-gi, nke i nọkwasiworo nam n'ogologo mb͕e-gi rue ta? ànọm nēme gi otú a ma-ọli? Ọ si, É-è. Jehova we saghe anya Belam abua, o we hu mọ-ozi nke Jehova ka ọ nēguzo n'uzọ, mma-agha-ya amiputara amiputa di kwa n'aka-ya: o we rube isi, kpọ isi ala n'iru-ya. Mọ-ozi nke Jehova we si ya, N'ìhi gini ka i tiworo nne-inyinya-ibu-gi ihe ub͕ò atọ ndia? le, mu onwem aputawo ibu onye-nmegide, n'ihi na uzọ-gi nārida na nbibi n'irum: nne-inyinya-ibu-gi we hum, wezuga onwe-ya n'irum ub͕ò atọ ndia: ọ buru na o wezugaghi onwe-ya site n'irum, n'ezie ub͕u a ọ bu kwa gi onwe-gi ka m'gēb͕uwori, ma ya onwe-ya ka m'gēmewori ka ọ di ndu. Belam we si mọ-ozi nke Jehova, Emehiewom; n'ihi na amaghm na gi onwe-gi nēguzo onwe-gi izutem n'uzọ: ma ub͕u a, ọ buru na ọ jọ njọ n'anya-gi, m'gālaghachi n'onwem. Mọ-ozi nke Jehova we si Belam, Soro ndikom ahu je: ma nání okwu ahu nke m'gāgwa gi, nke ahu ka i gēkwu. Belam we soro ndi-isi Belak je. Belak we nu na Belam abiawo, o we pua izute ya rue obodo Moab, nke di n'ókè-ala Anon, nke di na nsọtu ókè-ala ahu. Belak we si Belam, Èziteghm ozi ike ike n'ebe i nọ ikpọ gi? n'ìhi gini ka i nābiakuteghm? ọ̀ bu ezi-okwu na apughm isọpuru gi? Belam we si Belak, abiakutewom i: ub͕u a ọ̀ di ike ọ bula m'nwere ikwu ihe ọ bula? okwu ahu nke Chineke gētiye n'ọnum, nke ahu ka m'gēkwu. Belam we soro Belak je, ha we biarue Kiriat-huzot. Belak we chua ìgwè ehi na ìgwè ewu na aturu n'àjà, we zigara Belam, ziga-kwa-ra ndi-isi ndi ha na ya nọ. O rue, n'ututu, na Belak kuru Belam, me ka ọ rigo na Bamot-beal, ọ we si n'ebe ahu hu nsọtu ndi Israel.