Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū Reuben di n'akuku Ndida, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di; onye-isi umu Reuben nwere bu Elizua nwa Shedeua. Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ya agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ ise na nnù iri-na-isi na ọgu ise. Ndi nāma ulo-ikwū-ha n'akuku-ya bu ebo Simeon: onye-isi umu Simeon nwere bu Shelumiel nwa Zurishadai: usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ asa na nnù asatọ na ọgu ise: ebo Gad kwa: onye-isi umu Gad nwere bu Eliasaf nwa Reuel: usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ ise na nnù iri-na-anọ na ọgu abua na iri. Ndi nile agukọtara agukọta nke ọmuma-ulo-ikwū Reuben di orú nnù uzọ iri na asatọ, na nnù iri-na-asatọ, na ọgu iri-na-abua, na iri, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di. Ha gābu nke-abua n'ibuli ije.
Ulo-ikwū nzute gēbuli kwa ije, ya na ọmuma-ulo-ikwū ndi Livai, n'etiti ọmuma-ulo-ikwū nile: dika ha si ama ulo-ikwū-ha, otú a ka ha gēbuli ije, nwoke ọ bula n'akuku-ya, dika ọkọlọtọ nile ha si di.
Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū Efraim, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di, di n'akuku Ọdida-anyanwu: onye-isi umu Efraim nwere bu Elishama nwa Amihud. Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ ise na nnù na ọgu ise. N'akuku-ya ka ebo Manase di: onye-isi umu Manase nwere bu Gameliel nwa Pedahzua: Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ anọ, na ọgu iri: ebo Benjamin kwa: onye-isi umu Benjamin nwere bu Abidan nwa Gideoni: Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ anọ na nnù asatọ na ọgu iri. Ndi nile agukọtara agukọta nke ọmuma-ulo-ikwū Efraim di orú nnù uzọ iri-na-atọ, na nnù iri, na ọgu ise, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di. Ha gābu nke-atọ n'ibuli ije.
Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū Dan di n'akuku Ugwu, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di; onye-isi umu Dan nwere bu Ahieza nwa Amishadai. Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ asa na nnù iri-na-isi na ọgu iri-na ise. Ndi nāma ulo-ikwū-ha n'akuku-ya bu ebo Asha: onye-isi umu Asha nwere bu Pagiel nwa Ọkran: usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ ise na nnù atọ na ọgu iri-na-ise: ebo Naftali kwa: onye-isi umu Naftali nwere bu Ahira nwa Inan: usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ isi na nnù iri-na-atọ na ọgu iri. Ndi nile agukọtara agukọta nke ọmuma-ulo-ikwū Dan di orú nnù uzọ iri-na-iteghete, na nnù iri-na-anọ. Ha gābu ndi ikpe azu n'ibuli ije, dika ọkọlọtọ nile ha si di.
Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke umu Israel, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di: ndi nile agukọtara agukọta nke ọmuma-ulo-ikwū nile, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di, di orú nnù ọgu uzọ atọ na uzọ iri-na-ise, na nnù asatọ, na ọgu iri-na-asa, na iri. Ma agukọtaghi ndi Livai n'etiti umu Israel; dika Jehova nyere Moses iwu Umu Israel we me otú a; dika ihe nile Jehova nyere Moses n'iwu si di, otú a ka ha mara ulo-ikwū-ha dika ọkọlọtọ nile ha si di, ọ bu kwa otú a ka ha buliri ije, nwoke ọ bula dika ab͕uru nile ya si di, n'ulo nna-ya-hà