Ewe luzue mb͕idi ahu n'ubọchi nke-orú-na-ise nke ọnwa Elul, n'ọgu ubọchi abua na iri na abua. O rue, mb͕e ndi-iro-ayi nile nuru ya, na mba nile nke di ayi buruburu turu egwu, we da ada nke-uku n'anya nke aka ha: ha we mara na esitere n'aka Chineke-ayi je ozi a. Ọzọ, na mb͕e ahu ndi Juda amara aha-ha nēzigara Tobaia ọtutu akwukwọ-ozi, akwukwọ-ozi nke Tobaia nābiaru kwa ha aka. N'ihi na ọtutu madu di nime Juda ndi nwere iyi ha ṅuru ya, n'ihi na di nwa-nwayi Shekania nwa Ara ka ọ bu; Jehohanan nwa-ya lu-kwa-ra nwa-nwayi Meshulam nwa Berekaia na nwunye. Ha nēkwu kwa okwu bayere ezi omume-ya nile n'irum, ha nēburu kwa okwum nile pukuru ya. Akwukwọ-ozi ka Tobaia ziri ime ka m'tua egwu.
Gụọ NEHEMAIA 6
Geere nke a ntị NEHEMAIA 6
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NEHEMAIA 6:15-19
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo