Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NEHEMAIA 3:1-14

NEHEMAIA 3:1-14 IGBOB

Elaiashib, bú onye-isi-nchu-àjà, we bilie, ya na umu-nne-ya, bú ndi-nchu-àjà, ha we lua ọnu-uzọ-ama aturu; ha onwe-ha doro ya nsọ, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya; ọbuná rue ulo-elu Hamea ka ha doro ya nsọ, rue ulo-elu Hananel. N'akuku ya ka ndikom Jeriko luru. N'akuku ha ka Zakua nwa Imri luru. Ọnu-uzọ-ama azù ka umu Hasenaa luru; ndi ahu jikọtara ya n'otù, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile. N'akuku ha ka Meremot nwa Uraia, nwa Hakoz, mere ka mb͕idi di ike. N'akuku ha ka Meshulam nwa Berekaia, nwa Meshezabel, mere ka mb͕idi di ike. N'akuku ha ka Zedok nwa Beana mere ka mb͕idi di ike. N'akuku ha ka ndi Tekoa mere ka mb͕idi di ike; ma ndi-ha ndi di ebube etiyeghi olu-ha n'òfùfè Onye-nwe-ha. Ọnu-uzọ-ama ochie ka Joiada nwa Pasea na Meshulam nwa Besodeia mere ka ọ di ike; ndi ahu jikọtara ya n'otù, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile. N'akuku ha ka Melataia, bú onye Gibeon, na Jadon, bú onye Meronot, ndikom Gibeon na Mizpa, mere ka mb͕idi di ike rue oche-eze nke onye nāchi ala n'ofè osimiri. N'akuku ya ka Uziel nwa Hahaia, bú ndi-nnucha-ọla, mere ka mb͕idi di ike. N'akuku ya ka Hananaia, bú otù onye nime ndi nāsugwa manu-otite nēsì ísì utọ, mere ka mb͕idi di ike, ha we rapu Jerusalem rue mb͕idi di obosara. N'akuku ha ka Refaia nwa Hua, bú onye-isi nkera ala di Jerusalem buruburu, mere ka mb͕idi di ike. N'akuku ha ka Jedaia nwa Harumaf mere ka mb͕idi di ike, bú na ncherita-iru ulo-ya. N'akuku ya ka Hatush nwa Hashabneia mere ka mb͕idi di ike. Malkija nwa Harim na Hashub nwa Pahat-moab mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, bú ulo-elu nke ite-ọku uku. N'akuku ya ka Shalum nwa Halohesh, bú onye-isi nkera ala di Jerusalem buruburu, mere ka mb͕idi di ike, ya onwe-ya na umu-ya ndinyom. Ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu ka Hanun na ndi bi na Zanoa mere ka ọ di ike; ndi ahu luru ya, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile, na nnù cubit mb͕idi abua na ọgu iri rue ọnu-uzọ-ama ebe ikpofu ahihia. Ọnu-uzọ-ama ebe ikpofu ahihia ka Malkija nwa Rikab, bú onye-isi ala di Bet-hakerem buruburu, mere ka ọ di ike; onye ahu luru ya, guzo ibo-ọnu-uzọ-ya, na ihe-nkpachi-ya nile, na nkpọrọ-ya nile.