Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NEHEMAIA 12:27-47

NEHEMAIA 12:27-47 IGBOB

Ma n'ira mb͕idi Jerusalem nye Chineke ha chọputara ndi Livai n'ebe-ha nile, ime ka ha biarue Jerusalem, ime ememe nke ira mb͕idi Jerusalem nye Chineke, ọbuná n'iṅuri-ọṅu, na n'ikele-ekele, na n'ibù-abù, n'ájà na une na n'ubọ-akwara. Umu nke ndi-ọbù-abù we chikọta onwe-ha, ọbuná site na buruburu-ala nke di Jerusalem buruburu, site kwa n'obodo ntà nile nke ndi Netofa; site kwa na Bet-gilgal, site kwa n'ọhia nile nke Geba na Azmavet: n'ihi na ndi-ọbù-abù wuru obodo ntà nye onwe-ha buruburu Jerusalem. Ndi-nchu-àjà na ndi Livai we me onwe-ha ka ha di ọcha: ha me-kwa-ra ka ndi Israel na ọnu-uzọ-ama nile na mb͕idi di ọcha. M'we me ka ndi-isi Juda rigo n'elu mb͕idi, m'we guzo oké usu abua nke ndi nēkele ekele nēje kwa n'usoro; otù usu we je n'aka-nri n'elu mb͕idi rue ọnu-uzọ-ama nke ebe ikpofu ahihia: Hoshaia we jeso ha, ya na nkera ndi-isi Juda, na Azaraia, na Ezra, na Meshulam, na Juda, na Benjamin, na Shemaia, na Jeremaia, na ufọdu nime umu nke ndi-nchu-àjà, ndi chiri opì: na Zekarai nwa Jonatan, nwa Shemaia, nwa Matanaia, nwa Maikaia, nwa Zakua, nwa Esaf; na umu-nne-ya, bú Shemaia, na Azarel, na Milalai, na Gilalai, na Maai, na Netanel, na Juda, na Hanani, ndi chiri ihe abù nke Devid, bú onye nke Chineke; Ezra, bú ode-akwukwọ, nọ kwa n'iru ha: ha we rigo n'akuku ọnu-uzọ-ama isi-iyi, na ncherita-iru ha kwa, n'elu ihe-nrigo obodo Devid, nime nrigo mb͕idi, site n'akuku di n'elu n'ebe ulo Devid di, we rue ọnu-uzọ-ama miri n'akuku ọwuwa-anyanwu. Usu nke-abua nke ndi nēkele ekele nke nēje izute ha je-kwa-ra, mu onwem so-kwa-ra ha je, mu na nkera ndi-ayi, n'elu mb͕idi, site n'akuku di n'elu n'ebe ulo-elu nke ite-ọku uku di, we rue mb͕idi sara mbara; site kwa n'akuku di n'elu n'ebe ọnu-uzọ-ama Efraim di, na n'akuku ọnu-uzọ-ama ochie, na n'akuku ọnu-uzọ-ama azù, na ulo-elu Hananel, na ulo-elu Hamea, we rue ọnu-uzọ-ama aturu: ha we guzo n'ọnu-uzọ-ama ulo-nche. Usu abua ahu nke ndi nēkele ekele we guzo n'ulo Chineke, ha na mu onwem, nkera ndi nọchiri anya eze nọye-kwa-ram: ndi-nchu-àjà, bú Elaiakim, na Maaseia, na Miniamin, na Maikaia, na Elioenai, na Zekaraia, na Hananaia, guzo-kwa-ra chiri opì; na Maaseia, na Shemaia, na Eleeza, na Uzi, na Jehohanan, na Malkija, na Ilam, na Eza. Ndi-ọbù-abù na Jezrahia, bú onye-nlekọta-ha, we me ka anu olu-ha. Ha we chua àjà uku n'ubọchi ahu, we ṅuria; n'ihi na Chineke mere ka ha ṅuria ọṅu uku; ọzọ kwa, ndinyom-ha na umu-ntakiri-ha ṅuriri: ewe nu ọṅù Jerusalem rue ebe di anya. Ewe me ndikom ufọdu n'ubọchi ahu ka ha buru ndi nēlekọta ime-ulo nile nke idebe àkù, na idebe àjà-nbuli nile, na ibede nkpuru mbu, na idebe otù uzọ n'uzọ iri nile, ichikọbata nime ha, dika ubi obodo nile si di, òkè nile nke iwu nyere ndi-nchu-àjà na ndi Livai: n'ihi na ọṅù Juda di n'ihi ndi-nchu-àjà na n'ihi ndi Livai, bú ndi nēguzo eguzo. Ha we debe ihe-ndebe Chineke-ha, na ihe-ndebe ime-ka-adi-ọcha ahu, ha na ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama, dika ihe Devid na Solomon nwa-ya nyere n'iwu si di. N'ihi na n'ubọchi Devid na Esaf site na mb͕e ochie onye-isi nke ndi-ọbù-abù di, na abù otuto na ikele-ekele nke anābùku Chineke. Israel nile n'ubọchi Zerubabel, na n'ubọchi Nehemaia, nēnye kwa òkè nke ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama, ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya: ha nēdo-kwa-ra ndi Livai ihe nsọ; ndi Livai nēdo-kwa-ra umu Eron ihe nsọ.