Mb͕e Jisus gasiri ọzọ n'ub͕ọ ahu n'ofè ọzọ, oké ìgwè madu we zukọ n'ebe Ọ nọ: O we nọ n'usọ oké osimiri. Otù nime ndi-isi ulo-nzukọ, aha-ya bu Jeairọs, we bia; mb͕e ọ huru Ya, o we da n'ala n'ukwu-Ya, we riọsie Ya ike, si, Nwam nwanyi ntà nānwunyu anya: ariọm I ka I bia bikwasi ya aka-Gi abua, ka ewe zọputa ya, o we di ndu. O we so ya je; oké ìgwè madu we nēso Ya, ha nākpab͕u kwa Ya.
Otù nwanyi, nke nwere orùrù-ọbara arọ iri na abua, nke hu-kwa-rari ọtutu ahuhu n'aka ọtutu dibia, mefusia ihe nile o nwere, ma ọ baghi ya urù ọ bula, kama ọ jọkaria ya njọ, ebe ọ nuru ihe nile banyere Jisus, o we bia n'azu Ya n'etiti ìgwè madu ahu, we metu uwe-Ya aka. N'ihi na ọ nāsi, Ọ buru na emetum nání uwe-Ya aka, agāzọputam. Ngwa ngwa isi ọbara-ya kọsia; o we mara n'aru-ya na emere ya ka aru di ya ike n'ajọ ọria ahu. Ngwa ngwa, ebe Jisus mazuru na ike nke nēsi nime Ya puta apuwori, O chigharia n'ìgwè madu ahu, we si, Ònye meturu uwem aka? Ndi nēso uzọ-Ya we si Ya, I huwo ìgwè madu a ka ha nākpab͕u Gi, I nāsi kwa, Ònye meturum aka? O we le anya gburugburu ka Ọ hu nwanyi nke mere ihe a. Ma nwanyi ahu, ebe ọ matara ihe emere ya-ri, ọ tua egwu, ma kwa jijiji, bia da n'iru Ya, gwa Ya ezi-okwu nile. Ma Ọ siri ya, Nwam nwanyi, okwukwe-gi azọputawo gi; la n'udo, si n'ajọ ọria-gi nwe aru di ike.