I bà-kwa-ra ọzọ n'ulo-nzukọ-ha; otù nwoke nọ kwa n'ebe ahu nke aka-ya kpọnwuru akpọnwu. Ha we nēche Ya, ma Ọ gēme ka aru-ya di ike n'ubọchi-izu-ike; ka ha we bo Ya ebubo. O we si nwoke ahu aka-ya kpọnwuru akpọnwu, Bilie, puta n'etiti. O we si ha, Ò ziri ezi n'iwu ime ezi ihe, ma-ọbu ime ihe ọjọ, n'ubọchi-izu-ike? ìzọputa ndu, ma-ọbu ib͕u eb͕u? Ma ha kpuchiri ọnu-ha. Mb͕e O lesiri ha anya gburugburu n'iwe, ebe ọ nēwuta Ya nke-uku, bú na anēme ka obi-ha ma etili, O we si nwoke ahu, Setipu aka-gi. O we setipu ya: ewe me ka aka-ya di ka ọ di mbu. Ndi-Farisi we pua, ngwa ngwa ha na ndi Herod we b͕a ìzù megide Ya, ka ha gēsi la Ya n'iyì.
Jisus we wezuga Onwe-ya, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, je oké osimiri: oké ọtutu madu si na Galili soro: oké ọtutu madu si kwa na Judia, si kwa na Jerusalem, si kwa n'Aidumia, na ofè Jọdan, na buruburu Taia na Saidon, biakute Ya, mb͕e ha nuru ihe nile Ọ nēme, ka ha ra. O we gwa ndi nēso uzọ-Ya okwu, ka otù ub͕o ntà di nēche Ya n'ihi ìgwè madu ahu, ka ha ghara ikpab͕u Ya: n'ihi na O mereri ka aru ọtutu madu di ike; ya mere na ha dagidere Ya ka ha metu Ya aka, ka ha ra, bú ndi ajọ ọria di iche iche di n'aru. Ọzọ, mb͕e ọbula ndi-mọ nādighi ọcha lere Ya anya, ha nāda n'ala n'iru Ya, nēti nkpu, si, Gi onwe-gi bu Ọkpara Chineke. Ọ nābasi-kwa-ra ha nba ike, ka ha ghara ime ka Ọ puta ìhè.
O we rigo n'ugwu ahu, kpọ ha biakute Ya, bú ndi Ya onwe-ya chọrọ: ha we jekuru Ya. O we me ndikom iri na abua, ka Ya na ha we biri, ka O we nēzipu kwa ha ikwusa ozi ọma, na inwe ike ichupu ndi-mọ ọjọ: Saimon ka O nyekwasiri aha Pita; na Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwa-nne Jemes; ha ka O nyekwasiri aha Boanajis, nke bu, Umu éb͕è-elu-igwe: na Andru, na Filip, na Batọlọmiu, na Matiu, na Tomas, na Jemes nwa Alfiọs, na Tadiọs, na Saimon Kananaiọs, na Judas Iskariot, onye ra-kwa-ra Ya nye.
O we ba n'ulo. Ìgwè madu we b͕akọ ọzọ, ya mere na ha apughi ọbuná iri nri. Mb͕e ndi-ikwu-Ya nuru ya, ha we pua ijide Ya: n'ihi na ha nāsi, Anya adighi Ya nma.