Mb͕e ubọchi-izu-ike gasiri, Meri Magdalini, na Meri nne James, na Salomi, we zuta uda utọ di iche iche, ka ha we bia te Ya manu. N'isi-ututu n'ubọchi mbu nke ízù ubọchi asa, ha we bia rue ílì-Ya mb͕e anyanwu wara. Ha we sirita onwe-ha, Ònye gākpọrepuru ayi nkume ahu n'ọnu-uzọ ílì? Mb͕e ha lere anya n'elu, ha we hu na akpọreghachiwo nkume ahu: n'ihi na o riri nne nke-uku. Ha we ba n'ílì, hu nwa-okorọbia ka ọ nọduru n'aka-nri, b͕okwasi kwa uwe-nwuda ọcha; ibobo we nwua ha n'aru nke-uku. Ma ọ si ha, Ka ibobo ghara inwu unu n'aru nke-uku: unu nāchọ Jisus, Onye Nazaret, Onye akpọgideworo n'obe: emere ka O si n'ọnwu bilie; Ọ nọghi n'ebe a: le, ebe ha tọb͕ọrọ Ya! Kama labanu, si ndi nēso uzọ-Ya na Pita, O buru unu uzọ ga Galili: n'ebe ahu ka unu gāhu Ya, dika Ọ gwara unu. Ha we pua, si n'ílì ahu b͕alaga; n'ihi na ọma-jijiji na njubiga-anya-ókè nānwu ha n'aru: ha agwaghi kwa onye ọ bula ihe ọ bula; n'ihi na ha nātu egwu.
Gụọ MAK 16
Geere nke a ntị MAK 16
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MAK 16:1-8
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị