Mb͕e o ruru anyasi ub͕u a, ebe ọ bu Nkwadebe, nke bu ubọchi buru ubọchi-izu-ike uzọ, Josef nke Arimatia we bia, onye bu onye-nnọkọ-ikpé onye anāsọpuru, onye ya onwe-ya nēche kwa ala-eze Chineke; o were anya-ike bakuru Pailat, riọ aru Jisus. O we ju Pailat anya ma ọ buru na Ọ nwuruwori: o we kpọ ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise biakute ya, ọ jua ya ma ọ di anya mb͕e Ọ nwuru. Mb͕e ọ matara site n'ọnu ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise, o we rara ozu Jisus nye Josef n'efu. O we zuta ezi ákwà ọcha; mb͕e o budatasiri Ya, o we ke Ya n'ezi ákwà ọcha ahu, tọb͕ọ Ya n'ílì nke egwuwarari n'oké nkume; o we kpọre otù nkume kwachie ọnu-uzọ ílì ahu. Ma Meri Magdalini na Meri nne Joses huru ebe atọb͕ọrọ Ya.
Gụọ MAK 15
Geere nke a ntị MAK 15
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MAK 15:42-47
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị