Mb͕e Ọ nāputa n'ulo uku Chineke, otù onye n'etiti ndi nēso uzọ-Ya we si Ya, Onye-ozizí, le aha nkume na aha owuwu-ulo ndia bu! Jisus we si Ya, Ì huru oké owuwu-ulo ndia? Agaghi-arapu otù nkume ma-ọli n'ebe a n'elu nkume-ibe-ya, nke anāgaghi-akwatu n'ala.
Mb͕e Ọ nānọdu n'elu ugwu Olive na ncherita-iru ulo uku Chineke, Pita na Jemes na Jọn na Andru we jua Ya iche, si, Gwa ayi, òle mb͕e ihe ndia gābu? gini gābu kwa ihe-iriba-ama mb͕e ọ bula agaje imezu ihe ndia nile? Ma Jisus malitere isi ha, Lezienu anya ka onye ọ bula ghara iduhie unu. Ọtutu madu gābia n'aham, si, Mu onwem bu Ya; ha gēduhie kwa ọtutu madu. Ma mb͕e ọ bula unu gānu okwu agha di iche iche na akukọ agha di iche iche, unu atula ujọ: ihe ndia aghaghi iputa; ma ọgwugwu ihe nile akērughi. N'ihi na mba gēbili imegide mba ọzọ, ala-eze gēbili kwa imegide ala-eze ọzọ: ala-ọma-jijiji gādi n'ebe di iche iche; oké unwu di iche iche gādi: ihe ndia bu nmalite ihe-nb͕u.
Ma unu onwe-unu lezie anya n'onwe-unu: n'ihi na ha gārara unu nye n'aka nnọkọ-ikpé di iche iche; n'ulo-nzukọ di iche iche ka agāpia kwa unu ihe; n'iru ndi-isi na ndi-eze ka unu gēguzo kwa n'ihim, iburu ha àmà. Aghaghi kwa ibu uzọ kwusa ozi ọma nkem n'iru mba nile. Ma mb͕e ọ bula ha duru unu je ikpé, rara kwa unu nye, unu ebula uzọ nēcheb͕u onwe-unu okwu unu gēkwu: kama okwu ọ bula agēnye unu n'oge hour ahu, kwuenu nke ahu: n'ihi na ọ bughi unu onwe-unu nēkwu, kama ọ bu Mọ Nsọ. Nwa-nne gārara kwa nwa-nne-ya nye n'aka ọnwu, nna gārara kwa nwa-ya nye; umu gēbili kwa imegide ndi muru ha, me kwa ka ha nwua ọnwu. Madu nile gākpọ kwa unu asì n'ihi aham: ma onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agazọputa.
Ma mb͕e ọ bula unu gāhu ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ n'efu, ka ọ nēguzo n'ebe ọ nēkwesighi (onye nāgu, ya tugharia uche), mb͕e ahu ndi nọ na Judia, ka ha b͕alaga n'ugwu: onye nọ kwa n'elu ulo, ya ghara iridata, ma-ọbu ibà nime, ikwapu ihe ọ bula n'ulo-ya: onye nọ kwa n'ubi, ya ghara ilaghachi ichiri uwe-ya. Ma ahuhu gādiri ndi di ime na ndi nēnye nwa ara na mb͕e ahu. Ma kpenu ekpere ka ọ ghara idi na mb͕e oyi. N'ihi na mb͕e ahu gābu nkpab͕u, nke aha nkpab͕u di otú a akādighi site na nmalite òkìkè-uwa nke Chineke kère rue mb͕e a, ọ gaghi-adi kwa ma-ọli. Ọ buru kwa na Onye-nwe-ayi emeghi ubọchi ahu ka ha di nkpirikpi, agaghi-azọputa madu ọ bula: ma n'ihi ndi arọputara, ndi Ọ rọputara, O mere ka ubọchi ahu di nkpirikpi. Mb͕e ahu ọ buru na onye ọ bula gāsi unu, Le, Kraist nọ n'ebe a; ma-ọbu, Le, n'ebe ahu; unu ekwela: n'ihi na Kraist ugha di iche iche na ndi-amuma ugha gēbili, gosi kwa ihe-iriba-ama di iche iche na ọlu-ebube di iche iche, ka ha we duhie ndi arọputara, ma ọ buru na ọ gēkwe me. Ma unu onwe-unu lezie anya: le, agwawom unu ihe nile mb͕e akēmeghi ha.
Ma na mb͕e ahu, mb͕e nkpab͕u ahu gasiri, anyanwu gāb͕a ọchichiri, ọnwa agaghi-enye kwa ihè-ya, kpakpando nile ganāda kwa site n'elu-igwe, agēme kwa ka ike nile nke di n'elu-igwe me nkpatu. Mb͕e ahu ha gāhu kwa Nwa nke madu ka Ọ nābia n'igwe-oji nile n'oké ike na ebube. Mb͕e ahu Ọ gēzipu kwa ndi-mọ-ozi-Ya, me ka ndi nke Ya arọputara si n'ifufe anọ zukọ, site na nsọtu uwa rue nsọtu elu-igwe.
Ma site n'aru osisi fig mutanu ilu-ya: mb͕e ọ bula alaka-ya dibara nrò ub͕u a, pute kwa akwukwọ-ndu-ya, unu mara na mb͕e okpom-ọku di nso; otú a unu onwe-unu kwa, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe ndia ka ha nāputa, maranu na Ọ nọ nso, n'ọnu-uzo. N'ezie asim unu, Ọb͕ọ a agaghi-agabiga ma-ọli, rue mb͕e ihe ndia nile gēme. Elu-igwe na uwa gagabiga: ma okuwu nile nkem agaghi-agabiga ma-ọli.