O we ba Jerusalem, n'ulo uku Chineke; mb͕e O lesiri ihe nile anya buruburu, ebe ọ bu mb͕e anyasi ub͕u a, O we pua je Betani, Ya na ndi-ozi iri na abua ahu. N'echi-ya, mb͕e ha putara na Betani, agu guru Ya. Mb͕e Ọ huru osisi fig n'ebe di anya nke nwere akwukwọ ndu, Ọ bia, ma ebe ọ di otú a Ọ gāhu ihe n'elu ya: ma mb͕e Ọ biaruru ya aru, Ọ hughi ihe ọ bula ma-ọbughi akwuwọ ndu: n'ihi na ọ bughi oge nkpuru fig. O we za, si ya, Onye ọ bula eri-kwa-la nkpuru ọzọ si n'elu gi puta ebighi-ebi. Ndi nēso uzọ-Ya we nu ya. Ha we bia rue Jerusalem: O we ba n'ulo uku Chineke, malite ichupu ndi nēre na ndi nāzu n'ulo uku Chineke, O we kpùe table nile nteke ndi nāb͕anwe ego iru, na oche nile nke ndi nēre nduru; O kweghi kwa ka onye ọ bula būru ihe gabiga n'etiti ulo uku Chineke. O we zí ihe, si ha, Èdeghi ya n'akwukwọ nsọ, si, Agākpọ ulom ulo ekpere mba nile? ma unu onwe-unu emewo ya ọb͕à ndi nāpunara madu ihe. Ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ we nu ya, ha we nāchọ uzọ ha gēsi la Ya n'iyì: n'ihi na ha nātu egwu Ya, n'ihi na ibobo ozizí-Ya nwuru ìgwè madu nile n'aru. Mb͕e ọ bula o ruru anyasi Ọ nēsi n'obodo apu. Mb͕e ha nāga n'ututu, ha we hu osisi fig ahu na ọ kpọnwururi site na nkpọrọgwu. Pita we cheta, si Ya, Rabai, le, osisi fig nke I buru ọnu akpọnwuwo.
Gụọ MAK 11
Geere nke a ntị MAK 11
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MAK 11:11-21
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị