Mbe ha nābiaru Jerusalem nso, rue Betfagi na Betani nso, n'uzọ ugwu Olive, o we ziga madu abua n'etiti ndi nēso uzọ-Ya, si ha, Jenu n'obodo ntà nke di na ncherita-iru unu: ngwa ngwa mb͕e unu nābà nime ya, unu gāhu nwa-inyinya-ibu elibeworo, nke madu ọ bula akānọkwasighi; tọpunu ya, sekputa ya. Ọ buru kwa na onye ọ bula si unu, Gini mere unu nēme nka? sinu, Ọ di Onye-nwe-ayi nkpà; ngwa ngwa Ọ gēzighachi ya n'ebe a ọzọ. Ha we je, hu nwa-inyinya-ibu elibere n'ọnu-uzọ n'èzí n'amá; ha we tọpu ya. Ufọdu nime ndi guzoro n'ebe ahu we si ha, Ùnu nēme gini, nātọpu nwa-inyinya-ibu ahu? Ha we gwa ha okwu dika Jisus kwuru: ha we rapu ha. Ha we sekputara Jisus nwa-inyinya-ibu ahu, wukwasi ya uwe-ha; O we nọkwasi ya. Ọtutu madu we tusa uwe-ha n'uzọ; ndi ọzọ akwukwọ osisi, nke ha b͕ubitara n'ubi. Ndi naga n'iru, na ndi nēso, nēti nkpu, si, Hosanna; Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi: Ihe agọziri agọzi ka ala-eze bu nke nābia, ala-eze nke nna-ayi Devid: Hosanna n'ebe kachasi ihe nile elu. O we ba Jerusalem, n'ulo uku Chineke; mb͕e O lesiri ihe nile anya buruburu, ebe ọ bu mb͕e anyasi ub͕u a, O we pua je Betani, Ya na ndi-ozi iri na abua ahu.
Gụọ MAK 11
Geere nke a ntị MAK 11
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MAK 11:1-11
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị