Ha we bia rue Jeriko: mb͕e Ọ nāputa na Jeriko, Ya na ndi nēso uzọ-Ya na oké ìgwè madu, nwa-nwoke Timiọs, bú Bātimiọs, onye-aririọ kpuru ìsì, nānọdu n'akuku uzọ. Mb͕e ọ nuru na ọ bu Jisus Onye Nazaret, o we malite íti nkpu, na isi, Nwa Devid, Jisus, merem ebere. Ọtutu madu we bara ya nba, ka o kpuchie ọnu-ya: ma o tikariri nkpu nke-uku, si, Nwa Devid, merem ebere. Jisus we guzo, si, Kpọnu ya. Ha we kpọ onye-ìsì ahu, si ya, Nwe obi ike: bilie, Ọ nākpọ gi. O we chifu uwe-ya, zọlie, biakute Jisus. Jisus we za ya, si, Gini ka i nāchọ ka M'mere gi? Onye-ìsì ahu we si ya, Rabonai, ka eme ka m'hu uzọ. Jisus we si ya, Laba; okwukwe-gi azọputawo gi. Ngwa ngwa ewe me ka ọ hu uzọ, o we nēso Ya n'uzọ.