Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MAK 1:1-22

MAK 1:1-22 IGBOB

Nmalite ozi ọma jisus Kraist, Ọkpara Chineke. Dika edeworo ya n'akwukwọ Aisaia onye-amuma, si, Le, Mu onwem nēzipu onye-ozim ka ọ ga n'iru gi, Onye gēmezi uzọ-gi; Olu otù onye nēti nkpu n'ọhia, si, Dozienu uzọ Onye-nwe-ayi, Me okporo-uzọ-Ya ka ha guzozie; Jọn putara ìhè, onye nēme baptism n'ọhia, nēkwusa kwa baptism nchèghari inwe nb͕aghara nmehie. Ala Judia nile na ndi Jerusalem nile nāpukuru ya; ọ neme kwa ha baptism n'osimiri Jọdan, ha nēkwuputa nmehie nile ha. Jọn nēyi aji camel, nēke kwa akpukpọ-ọkiké n'úkwù-ya, nēri kwa igurube na manu-aṅu nke ọhia. Ọ nēkwusa kwa, si, Onye kam ike nābia n'azum, Onye m'nērughi iruru ala itọpu eriri akpukpọ-ukwu-Ya abua. Mu onwem jiri miri me unu baptism; ma Onye ahu geji Mọ Nsọ me unu baptism. O rue na mb͕e ahu, Jisus siri na Nazaret nke Galili bia, Jọn we mee Ya baptism nime Jọdan. Ngwa ngwa mb͕e O si na miri nārigo, Ọ huru elu-igwe ka ha nādọwa, Ọ hu-kwa-ra Mọ Nsọ dika nduru ka Ọ nēfedakwasi Ya: olu we si n'elu-igwe ahu da, si, Gi onwe-gi bu Ọkparam M'huru n'anya, ihe-Gi dim ezi nma. Ngwa ngwa Mọ Nsọ we chua Ya ba n'ọhia. O we nọ n'ọhia ọgu ubọchi abua, Setan nānwa Ya; Ya na anu ọhia nile nọ kwa; ndi-mọ-ozi nēje-kwa-ra Ya ozi. Ma mb͕e arasiiri Jọn nye, Jisus biara na Galili, nēkwusa ozi ọma Chineke, si, Oge ezuwo, ala-eze Chineke di kwa nso: chègharianu, kwe-kwa-nu n'ozi ọma. Mb͕e Ọ nāga n'usọ oké osimiri Galili, O we hu Saimon na Andru nwa-nne Saimon ka ha nāwuye úb͕ú n'oké osimiri: n'ihi na ha bu ndi-ọkù. Jisus we si ha, Bianu som n'azu, M'gēme kwa ka unu buru ndi-ọkù nākuta madu. Ngwa ngwa ha we rapu ihe nile ha ji eb͕u azù, so Ya. Mb͕e Ọ gara n'iru nke-ntà, O we hu Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwa-nne-ya, ndi nọ kwa n'ub͕ọ, nēkezi ihe ha ji eb͕u azù. Ngwa ngwa O we kpọ ha: ha we rapu nna-ha Zebedi n'ub͕o, ya na ndi-ọlu egoro ego, ha je so Ya n'azu. Ha we ga ba na Kapanaum; ngwa ngwa O we ba n'ulo-nzukọ-ha n'ubọchi-izu-ike we nēzí ihe. Ibobo ozizí-Ya we nwua ha n'aru: n'ihi na Ọ nēzí ha ihe dika O nwere ike, ọ bughi kwa dika ndi-ode-akwukwọ.