Ahuhu dirim! n'ihi na Adiwom ka mb͕e ha ghọkọtaworo nkpuru nke mb͕e nghọkọta-nkpuru, dika ntutukọ nkpuru ubi-vine fọduru nke ọghughọ-nkpuru-vine: ọ dighi otù uyọkọ nkpuru-vine fọduru iri; nkpuru-osisi fig nke buru uzọ cha ka nkpuru-obim chọsiworo ike. Onye-ebere alawo n'iyì pua n'uwa, ọ dighi kwa onye ziri ezi n'etiti madu: ha nile nēche anwu ọbara; ha ji ub͕u achu ntá, onye ọ bula nwa-nne-ya. Ọ bu n'elu ihe ọjọ ka ọbu-aka-ha abua di ime ya nke-ọma; onye-isi nāriọ, onye-ikpe ewe jikere n'ihi ugwọ; onye uku kwa, onye nēkwu ihe-ila-n'iyì nke nkpuru-obi-ya ka ọ bu: ha we tukọta ya dika udọ̀. Onye nke ha nke kachasi nma di ka uke: onye ziri ezi jọrọ njọ kari ogige ogwu: ubọchi ndi-nche-gi, bú nleta-gi, abiawo; ub͕u a ka mb͕e ib͕a ha ghari gādi. Unu ekwerela n'eyì, unu atukwasila eyì unu mara nke-ọma obi: debe eb͕ub͕ere-ọnu-gi ghara igwa nwanyi nēdina n'obi-gi okwu. N'ihi na nwa-nwoke nākpọ nna-ya onye-nzuzu, nwa-nwanyi nēbili imegide nne-ya, nwunye nwa imegide nne di-ya; ndi-iro madu bu ndi ulo-ya. Ma mu onwem, nime Jehova ka m'gēche nche nke-ọma; M'gēchere Chineke nke nzọputam: Chinekem gānu olum.
Gụọ MAIKA 7
Geere nke a ntị MAIKA 7
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MAIKA 7:1-7
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị