Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MAIKA 6

6
1Biko, nurunu ihe Jehova nāsi: Bilie, je ikpe n'iru ugwu nile, ka ugwu ntà nile nu kwa olu-gi. 2Unu ugwu, nurunu okwu ikpe Jehova; nu-kwa-nu, unu ntọ-ala uwa nke nādigide mb͕e nile: n'ihi na Jehova na ndi-Ya nēkperita ikpe, ọ bu kwa Israel ka Ọ gāruso uka. 3Ndim, gini ka M'meworo gi? ọ̀ bu kwa gini ka M'jiworo me ka ike gwu gi? b͕a àmà megidem. 4N'ihi na M'mere ka i si n'ala Ijipt rigoputa, ọ bu kwa n'ulo ndi-orù ka M'b͕aputara gi; M'we ziga Moses na Eron na Miriam iga n'iru gi. 5Ndim, biko, cheta ihe Belak, bú eze Moab, b͕ara n'ìzù, na ihe Belam nwa Beoa zara ya; cheta site na Shitim rue Gilgal, ka unu we mara ezi omume nile nke Jehova. 6M'gēji gini bia n'iru Jehova, rube isi n'iru Chineke di elu? #m'gābia n'iru Ya chiri ihe àjà-nsure-ọku, chiri umu-ehi b͕ara otù arọ? 7Ọ̀ gātọ Jehova utọ, bú nnù kwuru nnù ebulu ma-ọbu orú nnù kwuru orú nnù iyi manu? #m'gēnye ọkparam n'ihi njehiem, nkpuru afọm n'ihi nmehie nkpuru-obim? 8Gi madu, O gosiwo gi ihe di nma; ọ̀ bu kwa gini ka Jehova nāchọ n'aka-gi, ma-ọbughi nání ime ihe ekpere n'ikpe, na ihu ebere n'anya, na iji obi-ume-ala soro Chineke-gi nēje ije?
9Olu Jehova nākpọ obodo òkù, onye-nzube-ihe gāhu kwa aha-Gi: nurunu nkpa-n'aka, na Onye kaworo ya. 10Ọ̀ di àkù nmebi-iwu fọduru n'ulo onye-nmebi-iwu, ma-ọbu ephah nērughi eru nke nākpasu Chineke oké iwe? 11M'gādi ọcha n'obi mb͕e m'nwere ihe-ọtùtù nmebi-iwu, mb͕e m'nwe-kwa-ra akpa nkume-ọtùtù aghughọ? 12N'ihi na ndi-ọgaranya-ya juputara n'ihe-ike, ndi bi nime ya ekwuwo kwa okwu-ugha, ire-ha di kwa aghughọ n'ọnu-ha. 13Ọzọ kwa, Mu onwem etiputawom i ọnyá jọb͕uru onwe-ya; emewom i ka i tọb͕ọrọ n'efu n'ihi nmehie-gi nile. 14Gi onwe-gi gēri ihe, ma afọ agaghi-eju gi; afọ-awọrọ-gi gādigide kwa nime gi: i gēwezuga kwa ndi-gi, ma i gaghi-eme ka ha b͕apu; ma ndi i nēme ka ha b͕apu, ọ bu mma-agha ka M'gēwere ha nye. 15Gi onwe-gi gāgha nkpuru, ma i gaghi-ewe ihe-ubi: gi onwe-gi gāzọcha nkpuru osisi olive, ma i gaghi-ete manu n'aru gi; i gāzọchapu kwa manya-vine ọhu, ma i gaghi-aṅu manya-vine. 16N'ihi na anēdebe ukpuru nile nke Ọmri, na ọlu nile nke ulo Ehab, unu ewe jeghari nime ndum-ọdu nile ha: ka M'we me gi ka i ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, me kwa ndi bi nime-ya ka ha ghọ ihe-ima-ọsọ; ọ bu kwa ita-uta ndim ka unu gēbu.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

MAIKA 6: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye