Mb͕e Ọ nāgwa ha okwu ndia, le, otù onye-isi biara, we kpọ isi ala nye Ya, si, Nwam nwayi anwuruwo ọbuná ub͕u a: otú ọ di, bia bikwasi ya aka-Gi, na ọ gādi ndu. Jisus we bilie, so ya je, ndi nēso uzọ-Ya so-kwa-ra. Ma le, otù nwanyi, nke nwere orùrù-ọbara arọ iri na abua, biara n'azu Ya, we metu ọnu-ọnu uwe-Ya aka: n'ihi na ọ nāsi n'onwe-ya, Ọ buru na emetum nání uwe-Ya aka, agāzọputam. Ma Jisus chighariri, we hu ya, si, Nwam nwanyi, nwe obi-ike; okwukwe-gi azọputawo gi. Ewe site n'oge hour ahu zọputa nwanyi ahu. Mb͕e Jisus biara n'ulo onye-isi ahu, hu ndi-ọkwa-ọ̀jà, na ìgwè madu ka ha nātu ùzù, Ọ si, Wezuganu onwe-unu; n'ihi na nwa-ab͕ọghọ ntà ahu anwughi anwu, kama ọ nāraru ura. Ha we chìa Ya ọchì. Ma mb͕e achupuru ìgwè madu ahu, Ọ ba nime, jide ya n'aka; nwa-ab͕ọghọ ntà ahu we bilie. Ùdé a we pua gazue n'ala ahu dum.
Mb͕e Jisus nēsi n'ebe ahu nāga, ndi-ìsì abua we so Ya, nēti nkpu, si, Mere ayi ebere, Nwa Devid. Ma mb͕e Ọ batasiri n'ulo, ndi-ìsì ahu biakutere Ya: Jisus we si ha, Ùnu kwere na apurum ime ihe a? Ha si Ya, E, Onye-nwe-ayi. Mb͕e ahu O meturu anya-ha aka, si, Dika okwukwe-unu si di ka emere unu. Ewe saghe anya-ha. Jisus we dọ ha aka na nti nke-uku, si, Lezienu anya ka onye ọ bula ghara ima ya. Ma ha puru, b͕asa ùdé-Ya n'ala ahu dum.
Mb͕e ha nāpu, le, ekutara Ya onye-ob͕i nke mọ ọjọ ji. Mb͕e achupusiri mọ ọjọ ahu, onye-ob͕i ahu we kwue okwu: ibobo we nwua ìgwè madu nile n'aru, ha si, Ọ dighi mb͕e ọ bula egosiri ya otú a n'Israel. Ma ndi-Farisi nāsi, N'ike onye-isi ndi-mọ ọjọ ka Ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ.
Jisus we nējeghari n'obodo na obodo ntà ha nile, nēzí ihe n'ulo-nzukọ nile ha, nēkwusa kwa ozi ọma nke ala-eze ahu, nāgwọ kwa ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche. Ma mb͕e Ọ huru ìgwè madu nile, O nwere ọmiko n'aru ha, n'ihi na anēsob͕u ha, nāchusa kwa ha, dika aturu nēnweghi onye nāzù ha. Mb͕e ahu Ọ si ndi nēso uzọ-Ya, Owuwe-ihe-ubi riri nne n'ezie, ma ndi-ọlu di ole-na-ole. Ya mere, nāriọnu Onye-nwe owuwe-ihe-ubi ahu, ka O zipu ndi-ọlu bà n'owuwe-ihe-ubi-Ya.