Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 9:1-13

MATIU 9:1-13 IGBOB

O we ba nime ub͕ọ, gabiga n'ofè ọzọ, bia n'obodo nke aka Ya. Ma le, ha butere Ya onye akuku-aru-ya nwuru anwu, tọb͕ọrọ n'ihe-ndina: mb͕e Jisus huru okwukwe-ha Ọ si onye ahu akuku-aru-ya nwuru anwu, Nwa, nwe obi-ike; anāb͕aghara gi nmehie-gi nile. Ma le, ufọdu n'etiti ndi-ode-akwukwọ kwuru nime onwe-ha, si, Nwoke a nēkwulu Chineke. Ma Jisus, ebe ọ mara ihe nile di ha n'obi, Ọ si, Gini mere unu nēchè ajọ ihe n'obi-unu? N'ihi na, òle nke ka nfe, isi, Anāb͕aghara gi nmehie-gi nile; ma-ọbu isi, Bilie, jeghari kwa? Ma ka unu we mata na Nwa nke madu nwere ike n'elu uwa ib͕aghara nmehie (mb͕e ahu Ọ siri onye ahu ukwu-ya nwuru anwu), Bilie, chiri ihe-ndina-gi, la n'ulo-gi. O we bilie, la n'ulo-ya. Ma mb͕e ìgwè madu nile huru ya, ha turu egwu, we nye Chineke otuto, Onye nyere madu ike di otú a. Mb͕e Jisus nēsi n'ebe ahu nāga, Ọ huru otù nwoke, anākpọ Matiu, ka ọ nọduru n'ulo-ùtú: Ọ si ya, Som. O we bilie, so Ya. O rue, mb͕e Ọ nọduru na nri n'ulo-ya, le, ọtutu ndi-ọna-utu na ndi-nmehie biara so Jisus na ndi nēso uzọ-Ya nọdu na nri. Mb͕e ndi-Farisi huru ya, ha we si ndi nēso uzọ-Ya, N'ìhi gini ka Onye-ozizí-unu nēso ndi-ọna-utu na ndi-nmehie ndia eri ihe? Ma mb͕e Ọ nuru ya, Ọ si, Nkpà dibia akpaghi ndi di ike, kama ọ nākpà ndi aru nādighi nma. Ma ganu muta ihe okwu a bu, Anamachọ ebere, ọ bughi àjà: n'ihi na abiaghm ikpọ ndi ezi omume, kama ọ bu ndi-nmehie.