Mb͕e Ọ batara na Kapanaum, otù ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise biakutere Ya, nāriọ Ya, si, Onye-nwe-ayi, onye nējerem ozi tọb͕ọrọ n'ulom, akuku-aru-ya nwuru anwu, anēmekpa ya aru gabiga ókè. O we si ya, Mu onwem gābia me ka aru di ya ike. Ma ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise zara, si, Onye-nwe-ayi, erughm ka I ba n'okpuru ulom: kama were nání okwu-ọnu kwue, agēme kwa ka aru onye nējerem ozi di ike. N'ihi na mu onwem bu kwa onye nọ n'okpuru ike, nēnwe ndi-agha n'okpuru mu onwem: m'we si onye a, Ga, ọ ga; m'si kwa onye ọzọ, Bia, ọ bia; m'si kwa orùm, Me nka, o me ya. Ma mb͕e Jisus nuru nka, o juru Ya anya, Ọ, we si ndi n'eso ya n'azu, N'ezie asim unu, Ọ dighi mb͕e M'huru oké okwukwe di otú a n'aru onye ọ bula n'Israel. Ma asim unu, na ọtutu madu gēsi n'Ọwuwa-anyanwu na Ọdida-anyanwu bia, so kwa Abraham, na Aisak, na Jekob, nānọdu n'ala-eze elu-igwe: ma agāchupu umu ala-eze ahu bà n'ọchichiri nke èzí: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi. Jisus we si ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise, Laba; dika i kwere, ka emere gi. Ewe me ka aru onye nējere ya ozi di ike n'oge hour ahu.