Gini mere unu nēcheb͕u kwa onwe-unu nye uwe-oyiyi? Ribanu urodi nke ubi ámá, otú ha nētó etó; ha adọb͕ughi onwe-ha n'ọlu, ha atughi kwa ogho: ma asim unu, na ọbuná Solomon n'ebube-ya nile, eb͕okwasighi ya ákwà dika otù nime ndia. Ma ọ buru na Chineke eyikwasi ahihia nke ubi uwe otú a, nke di ta, echi atubà ya n'ite ọku, Ọ̀ gaghi-eyikwasi kari unu uwe nke-uku, unu ndi okwukwe ntà? Ya mere, unu echeb͕ula onwe-unu, si, Gini ka ayi gēri? ma-ọbu, Gini ka ayi gāṅu? ma-ọbu, Gini ka agēji b͕okwasi ayi? N'ihi na ihe ndia nile ka ndi mba ọzọ nāchọ; n'ihi na Nna-unu nke elu-igwe nāmata na ihe ndia nile di unu nkpà. Ma burunu uzọ chọ ala-eze-Ya, na ezi omume-Ya; agātukwasi-kwa-ra unu ihe ndia nile.
Gụọ MATIU 6
Geere nke a ntị MATIU 6
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MATIU 6:28-33
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị