Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 6:1-15

MATIU 6:1-15 IGBOB

Lezienu anya ka unu ghara ime ezi omume-unu n'iru madu, ka ha we kiri unu: ma unu emeghi otú a unu enweghi ugwọ-ọlu n'ebe Nna-unu Nke bi n'elu-igwe nọ. Ya mere, mb͕e ọ bula i nālu ọlu ebere, afùla opì n'iru gi, ọbuná dika ndi-iru-abua nēme n'ulo-nzukọ-unu na n'uzọ-unu, ka ha we nara otuto n'aka madu. N'ezie asim unu, Ha nēnwezu ugwọ-ọlu-ha. Ma mb͕e i nālu ọlu ebere, ka aka-ekpe-gi ghara ima ihe aka-nri-gi nēme: ka ọlu ebere gi we di na nzuzo: Nna-gi Nke nāhu ihe na nzuzo gēnyeghachi kwa gi. Mb͕e ọ bula unu nēkpe kwa ekpere, unu agaghi-adi ka ndi-iru-abua ahu: n'ihi na ọ nātọ ha utọ iguzo n'ulo-nzukọ-unu na nkuku amá-unu ikpe ekpere, ka ha we were onwe-ha gosi madu. N'ezie asim unu, Ha nēnwezu ugwọ-ọlu-ha. Ma gi onwe-gi, mb͕e ọ bula i nēkpe ekpere, bà n'ime-ulo ntà gi, mb͕e i mechisi-kwa-ra uzọ-gi, kpere Nna-gi Nke di na nzuzo, Nna-gi Nke nāhu ihe na nzuzo gēnyeghachi kwa gi. Ma mb͕e unu nēkpe ekpere, unu ekwula okwu-nkwukwasi efù, dika ndi mba ọzọ nēme: n'ihi na ha nēchè na agānu olu-ha n'ọtutu okwu ha nēkwu. Ya mere, unu eyila ha: n'ihi na Nna-unu matara ihe nile di unu nkpà, mb͕e unu akāriọghi Ya. Ya mere, kpenu ekpere otú a: Nna-ayi Nke bi n'elu-igwe, Ka edo aha-Gi nsọ. Ka ala-eze-Gi bia. Ka eme ihe nāchọ, dika esi eme ya n'elu-igwe, ka eme kwa otú ahu n'uwa. Nye ayi nri ta nke gēzuru ayi n'ubọchi ta. B͕aghara kwa ayi ugwọ nile ayi ji, dika ayi onwe-ayi b͕agharawo-kwa-ra ndi ji ayi ugwọ. Ewebàla ayi nime ọnwunwa, kama dọputa ayi n'aka ajọ onye ahu. N'ihi na ọ buru na unu ab͕aghara madu ndahie nile ha, Nna-unu gāb͕aghara kwa unu. Ma ọ buru na unu ab͕agharaghi madu ndahie nile ha, Nna-unu agaghi-ab͕aghara unu ndahie-unu.