Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 5:21-42

MATIU 5:21-42 IGBOB

Unu nuru na agwara ndi-ochie, si, Eb͕ula madu; ma onye ọ bula nke b͕uru madu gēnye onwe-ya n'aka ikpé: ma Mu onwem si unu, na onye ọ bula nke nēwe iwe megide nwa-nne-ya gēnye onwe-ya n'aka ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa nwa-nne-ya, Raka, gēnye onwe-ya n'aka nnọkọ-ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa, Onye-nzuzù, gēnye onwe-ya n'aka ọku ala-mọ. Ya mere ọ buru na i nēche onyinye-gi n'iru Chineke n'ebe-ichu-àjà, i we cheta n'ebe ahu na nwa-nne-gi nwere ihe megide gi, rapu onyinye-gi n'ebe ahu n'iru ebe-ichu-àjà, laba, buru uzọ me ka gi na nwa-nne-gi di n'udo, mb͕e ahu bia kwa che onyinye-gi. Me ka gi na onye nēkuru gi ga ikpé me eyì ọsọsọ, mb͕e gi na ya nọ n'uzọ; ka onye ahu nēkuru gi ga ikpe we ghara irara gi nye n'aka onye-ikpe ma eleghi anya, onye ikpe arara kwa gi nye n'aka onye nēje ozi, ewe tubà gi n'ulo-nkpọrọ. N'ezie asim i, I gaghi-aputa n'ebe ahu ma-ọli, rue mb͕e i gākwughachi farthing ikpe-azu. Unu nuru na ekwuru, si, Akwala iko: ma Mu onwem si unu, na nwoke ọ bula nke nēle nwanyi anya ka agu ya we gua ya, ọ kwasiwo ya iko n'obi-ya ub͕u a. Ma ọ buru na anya aka-nri gi eme gi ka i ma n'ọnyà, ghupu ya, tupu kwa ya n'aru-gi: n'ihi na ọ bara gi urù ka otù nime ihe di gi n'aru la n'iyì, ka aghara kwa itubà aru-gi dum n'ọku ala-mọ. Ma ọ buru na aka-nri-gi eme gi ka i ma n'ọnya, bipu ya, tupu kwa ya n'aru-gi: n'ihi na ọ bara gi urù ka otù nime ihe di gi n'aru la n'iyì, ka aru-gi dum ghara kwa ije n'ọku ala-mọ. Ekwu-kwa-ra, si, Nwoke ọ bula nke gārapu nwunye-ya, ya nye ya akwukwọ nkewa: ma Mu onwem si unu, na nwoke ọ bula nke nārapu nwunye-ya, ma-ọbughi n'ihi ikwa-iko, ọ nēme nwanyi ahu ka ọ nọ n'ọnọdu onye akwara iko megide: onye ọ bula nke gālu kwa ya mb͕e arapusiri ya, ọ nākwa iko. Ọzọ kwa, unu nuru na agwara ndi-ochie, si, Aṅula iyí ugha, kama nyeghachi Onye-nwe-ayi ihe nile i ṅuru n'iyí: ma Mu onwem si unu, Aṅula iyí ma-ọli; ejila elu-igwe ṅu, n'ihi na ọ bu oche-eze Chineke; eji-kwa-la ala, n'ihi na ọ bu ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Ya; aṅukwala iyí n'ebe Jerusalem di, n'ihi na ọ bu obodo nke Eze uku ahu. Eji-kwa-la isi-gi ṅu iyí, n'ihi na i pughi ime otù agiri-isi ka ọ di ọcha ma-ọbu ka ọ di oji. Ma ka okwu-unu buru, E, e; É-è, é-è: ma ihe ọ bula kariri ndia nēsite n'ajọ onye ahu. Unu nuru na ekwuru, si, Anya lara anya, ezé lara ezé: ma Mu onwem si unu, Eguzogidela onye bu ajọ onye: kama onye ọ bula nāku gi ura na ǹtì aka-nri, tughari-kwa-ra ya ǹtì ọzọ. Ma ọ buru na onye ọ bula nāchọ ka gi na ya je ikpé, ka o we nara gi uwe-ime-gi, rapu-kwa-ra ya oké uwe-gi. Onye ọ bula nke gējide gi ije otù mile, so ya je mile abua. Nye onye nāriọ gi, ab͕akuta-kwa-la ya azú, bú onye nāchọ ka i binye ya ihe.

Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara MATIU 5:21-42