Ma mb͕e Ọ huru ìgwè madu ahu, Ọ rigoro n'ugwu ahu: mb͕e Ọ nọduru ala, ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya: O we saghe ọnu-Ya, zí ha ihe, si, Ngọzi nādiri ndi bu ob͕eye nime mọ-ha: n'ihi na ala-eze nke elu-igwe bu nke ndi ahu. Ngọzi nādiri ndi nēru újú: n'ihi na ndi ahu ka agākasì obi. Ngọzi nādiri ndi di nwayọ n'obi: n'ihi na ndi ahu gēketa uwa. Ngọzi nādiri ndi agu ezi omume nāgu, ndi akpiri nākpọ kwa nku na ya: n'ihi na ndi ahu ka afọ gēju. Ngọzi nādiri ndi-ebere: n'ihi na ndi ahu ka agēmere ebere. Ngọzi nādiri ndi di ọcha n'obi: n'ihi na ndi ahu gāhu Chineke. Ngọzi nādiri ndi nēme ka madu na ibe-ha di n'udo: n'ihi na ndi ahu ka agākpọ umu Chineke. Ngọzi nādiri ndi esob͕uworo n'ihi ezi omume: n'ihi na ala-eze elu-igwe bu nke ndi ahu. Ngọzi nādiri unu mb͕e ọ bula ha nāta unu uta, nēsob͕u kwa unu, nēkwu kwa ajọ ihe nile di iche iche megide unu n'okwu-ugha, n'ihim. Ṅurianu ọṅu, ka obi tọ kwa unu utọ nke-uku: n'ihi na ugwọ-ọlu-unu di uku n'elu-igwe: n'ihi na otú a ka ha sob͕uru ndi-amuma ndi buru unu uzọ. Unu onwe-unu bu nnú nke uwa: ma ọ buru na nnú etufuwo utọ-ya, àgēji gini me ya ka ọ ghọ ezi nnú? ọ dighi kwa irè iji me ihe ọ bula ọzọ, ma-ọbughi ka etufue ya n'èzí, madu azọ ya ukwu. Unu onwe-unu bu ìhè nke uwa. Apughi izo obodo nke ewuworo n'elu ugwu.
Gụọ MATIU 5
Geere nke a ntị MATIU 5
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MATIU 5:1-14
21 Days
Start your new year with a focus on the spiritual discipline of fasting. This plan includes several passages about fasting and others that encourage reflection and closeness to God. For 21 days, you'll get a daily Bible reading, a brief devotional, reflection questions, and a prayer focus. For more content, check out www.finds.life.church.
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe offlaịnụ, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ihe ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị