Ma mb͕e ubọchi-izu-ike nāgwu, mb͕e chi ubọchi mbu n'ízù ubọchi asa nābọ, Meri Magdalini na Meri ọzọ biara ile ílì ahu. Ma le, ala-ọma-jijiji uku dara; n'ihi na mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi si n'elu-igwe ridata, bia rue, bupu nkume ahu, we nọkwasi ya. Oyiyi-ya di ka àmùmà, uwe-ya nācha kwa ucha dika snow: site n'egwu ya ndi-nche mara jijiji, bia di ka ndi nwuru anwu. Ma mọ-ozi ahu zara, si ndinyom ahu, Unu onwe-unu atula egwu: n'ihi na amatawom na unu nāchọ Jisus, Onye akpọgideworo n'obe. Ọ nọghi n'ebe a; n'ihi na emere ka O si n'ọnwu bilie, dika O kwuru. Bianu, le ebe Ọ tọb͕ọrọ. Ga-kwa-nu ọsọsọ, si ndi nēso uzọ-Ya, Emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie; ma le, O buru unu uzọ ga Galili; n'ebe ahu ka unu gāhu Ya: le, agwawom unu.
Gụọ MATIU 28
Geere nke a ntị MATIU 28
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MATIU 28:1-7
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị