Ma n'echi-ya, nke bu ubọchi so ubọchi Nkwadebe, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi zukọrọ jekuru Pailat, si, Onye-nwe-ayi, ayi chetara na Onye-nduhie ahu siri, mb͕e Ọ nọ na ndu, Mb͕e ubọchi atọ gasiri M'gēsi n'ọnwu bilie. Ya mere, nye iwu ka emechie ílì ahu si-ike rue ubọchi nke-atọ, ka ndi nēso uzọ-Ya ghara ibia zuru Ya la ma eleghi anya, we si ndi-Ju, Emere ka O si na ndi nwuru anwu bilie: njehie ikpe-azu a gājọ kwa njọ kari nke-mbu. Pailat siri ha, Unu nwere òtù ndi-nche: labanu, mechienu ya si-ike, dika unu matara. Ha we ga, mechie ílì ahu si-ike, n'ika akàrà na nkume ahu, ha na òtù ndi-nche ahu yikọrọ.
Gụọ MATIU 27
Geere nke a ntị MATIU 27
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MATIU 27:62-66
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị