Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 27:1-31

MATIU 27:1-31 IGBOB

Ma mb͕e o ruru ututu, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nile nke ndi-Ju b͕ara ìzù megide Jisus ime ka Ọ nwua: ha we ke Ya ab͕u, dupu Ya, rara Ya nye n'aka Pailat onye-isi. Mb͕e ahu Judas, onye rara Ya nye, mb͕e ọ huru na amara Ya ikpé, ọ kwa uta, chighachi orú ego ọla-ọcha na iri ahu nye ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye, si, Emehierem n'irara ọbara Onye ikpé nāmaghi nye. Ma ha siri, Òle nke diri ayi nime ya? gi onwe-gi le nke ahu. O we tubà ego ọla-ọcha ahu nile n'ulo nsọ, wezuga onwe-ya; o we je, kwub͕u onwe-ya. Ndi-isi-nchu-àjà we nara ego ọla-ọcha nile, si, O zighi ezi n'iwu itubà ha n'ebe anēdebe ihe enyere Chineke, ebe ọ bu ọnu-ahia ọbara. Ha we b͕a ìzù, chiri ha zuta ubi ọkpu-ite, ilì ndi-ọbìa. N'ihi nka ka akpọrọ ubi ahu, Ubi ọbara, rue ta. Mb͕e ahu okwu ekwuru site n'ọnu Jeremaia onye-amuma mezuru, si, Ha we chiri orú ego ọla-ọcha na iri ahu, bú ọnu-ahia nke Onye aruru ọnu-ahia-Ya, Onye ufọdu site na umu Israel ruru ọnu-ahia-Ya; ha we nye ha iji zuru ubi ọkpu-ite, dika Onye-nwe-ayi nyerem iwu. Ma Jisus guzoro n'iru onye-isi: onye-isi ahu we jua Ya, si, Gì onwe-gi bu Eze ndi-Ju? Jisus we si ya, Gi onwe-gi kwuru. Ma mb͕e ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nēbo Ya ebubo, Ọ zaghi ihe ọ bula. Mb͕e ahu Pailat si Ya, Ì nughi ka ọtutu ihe ha nāb͕a àmà megide Gi ra? Ma Ọ zaghi ya, ọbuná rue otù okwu: ya mere na o juru onye-isi ahu anya nke-uku. Ma n'ememe onye-isi nārapuru ọra ndi-Ju otù onye-nkpọrọ, onye ha nāchọ. Ma mb͕e ahu ha nwere onye-nkpọrọ onye ọra madu mara, anākpọ Barabas. Ya mere, mb͕e ha zukọrọ, Pailat si ha, Ònye ka unu nāchọ ka m'rapuru unu? Barabas, ma-ọbu Jisus Onye anākpọ Kraist? N'ihi na ọ matara na ha rara Ya-ri nye n'ihi ekworo. Mb͕e ọ nọkwasiri n'oche-ikpé, nwunye-ya zigara ya, si, Aka-gi adila n'okwu Onye ezi omume ahu: n'ihi na ahujurum ọtutu ihe anya na nrọ ta n'ihi Ya. Ma ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye rafuru ìgwè madu nile ka ha riọ ya Barabas, ma la Jisus n'iyì. Ma onye-isi ahu zara, si ha, Ònye nime madu abua ahu ka unu nāchọ ka m'rapuru unu? Ha we si, Barabas. Pailat si ha, Ọ̀ bu gini ka m'gēme kwa Jisus Onye anākpọ Kraist? Ha nile si, Ka akpọgide Ya n'obe. O we si, É-è, n'ihi na Ò mere ihe ọjọ gini? Ma ha tibigara nkpu ókè, si, Ka akpọgide Ya n'obe. Ma mb͕e Pailat huru na okwu-ya abaghi n'ihe ọ bula, kama na ùzù nāputa, o were miri, kwọ aka-ya abua n'iru ìgwè madu ahu, si, Ikpé ọbara Onye ezi omume a amaghm: unu onwe-unu le nke ahu. Ndi-Ju nile we za, si, Ọbara-Ya di ayi n'isi, di kwa n'isi umu-ayi. Mb͕e ahu ọ rapuru ha Barabas: ma ọ rara Jisus nye, mb͕e ọ piasiri Ya ihe, ka ewe kpọgide Ya n'obe. Mb͕e ahu ndi-agha nke onye-isi kuru Jisus tiyere onwe-ha ba na Pritoriọm, ha we me ka òtù-ha dum zukọ n'ebe Ọ nọ. Ha we yipu uwe-Ya, yikwasi Ya uwe uhie. Mb͕e ha kpasiri okpu-eze nke eji ogwu me, ha were ya kpube Ya n'isi, nye kwa Ya amì n'aka-nri-Ya; ha we b͕ue ikperè n'iru Ya, me Ya ihe-ọchì, si, Ekele, Eze ndi-Ju! Ha busa-kwa-ra Ya ọnu-miri, were kwa amì ahu nēti Ya n'isi. Mb͕e ha mesiri Ya ihe-ọchì, ha we yipu Ya uwe ahu, yikwasi Ya uwe-Ya nile, dupuga Ya ikpọgide Ya n'obe.