Ma mb͕e Jisus nọ na Betani, n'ulo Saimon onye-ekpenta, otù nwanyi biakutere Ya nke nēji ite alabaster, nke manu-otite di oké ọnu-ahia nke-uku di ya, o we wusa manu-otite ahu n'isi-Ya, mb͕e Ọ nọduru na nri. Ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya huru ya, iwe were ha nke-uku, ha si, Èji ila-n'iyì nka me gini? N'ihi na apuru ire manu-otite a oké ọnu-ahia, we nye ndi-ob͕eye. Ma mb͕e Jisus mara ya, Ọ si ha, Gini mere unu nēsob͕u nwanyi a? n'ihi na ọ luru ọlu ọma n'arum. N'ihi na unu nwere ndi-ob͕eye n'etiti unu mb͕e nile; ma unu enweghi Mu onwem mb͕e nile. N'ihi na n'iwusi manu-otite a n'arum, o mere ya ka o we doziem n'olìlì. N'ezie asim unu, Ebe ọ bula agēkwusa ozi ọma nka n'uwa dum, agēkwuta kwa ihe nke nwanyi a mere, ka ọ buru ihe-ncheta-ya.
Gụọ MATIU 26
Geere nke a ntị MATIU 26
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MATIU 26:6-13
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị