Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, le, Judas, otù onye n'etiti ndi-ozi iri na abua ahu, we bia, ya na oké ìgwè madu ndi chiri mma-agha na osisi, site n'ebe ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nke ndi-Ju nọ. Ma onye nārara Ya nye nyere ha ihe-iriba-ama, si, Onye ọ bula m'gēsutu ọnu, Onye ahu bu Ya: jidenu Ya. Ngwa ngwa ọ biakutere Jisus, si, Ekele, Rabai; o we sutu Ya ọnu nke-uku. Jisus we si ya, Eyim, me ihe i biara ime. Mb͕e ahu ha biakutere Ya, we tukwasi Jisus aka, jide Ya. Ma le, otù onye nime ndi ha na Jisus nọ setiri aka-ya, miputa mma-agha-ya, b͕u orù onye-isi-nchu-aja mma, bipu nti-ya. Mb͕e ahu Jisus si ya, Mighachi mma-agha-gi n'ọnọdu-ya: n'ihi na madu nile ndi were mma-agha gāla n'iyì site na mma-agha. Ma-ọbu i nēchè na apughm iriọ Nnam, Ọ gēzite-kwa-ram ọbuná ub͕u a kari legion iri na abua nime ndi-mọ-ozi? Ihe edeworo n'akwukwọ nsọ gēsi kwa aṅa mezu, na ọ ghaghi ime otú a? N'oge hour ahu Jisus siri ìgwè madu ahu, Ùnu putara chiri mma-agha na osisi ijidem, dika imegide onye nāpunara madu ihe? Kwa-ubọchi M'nọduru n'ulo uku Chineke nēzí ihe, ma unu ejideghm. Ma emewo ihe a dum, ka ihe nile ndi-amuma dere n'akwukwọ we mezu. Mb͕e ahu ndi nile nēso uzọ-Ya rapuru Ya, b͕alaga.