Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 26:36-75

MATIU 26:36-75 IGBOB

Mb͕e ahu Jisus na ha biarue ogige anākpọ Getsemane, Ọ we si ndi nēso uzọ-Ya, Nọdunu n'ebe a, rue mb͕e M'gēje n'ebe ahu kpe ekpere. O we kuru Pita na umu Zebedi abua tiyere Onwe-ya, o we malite iwuta Ya n'obi, obi malite-kwa-ra ilọ Ya miri. Mb͕e ahu Ọ si ha, Ọ nēwuta nkpuru-obim nke-uku, rue ọnwu: nọgidenu n'ebe a, som nēche nche. O we ga n'iru nke-ntà, da kpuchiè iru-Ya n'ala, we kpe ekpere, si, Nnam, ọ buru na ọ gēkwe me, ka iko a gabigam: ma ọ bughi dika Mu onwem nāchọ, kama dika Gi onwe-gi nāchọ. O we biakute ndi nēso uzọ-Ya, Ọ hu ha ka ha nāraru ura, O we si Pita, Ùnu di otú a nēnweghi ike isom che nche otù oge hour? Nēchenu nche, nēkpe-kwa-nu ekpere, ka unu we ghara ibà n'ọnwunwa: mọ nke madu di ọku n'ezie, ma anu-aru adighi ike. O we rapu ha je kwa ọzọ nke ub͕ò abua, kpe ekpere, si, Nnam, ọ buru na nka apughi igabiga, ma ọ buru na aṅughm ya, ka eme ihe I nāchọ. O we bia kwa ọzọ, hu ha ka ha nāraru ura, n'ihi na anya-ha di arọ́. O we rapu ha ọzọ, je, kpe ekpere nke ub͕ò atọ, nēkwu otù okwu ahu ọzọ. Mb͕e ahu Ọ biakute ndi nēso uzọ-Ya, si ha, Nārarunu ura site n'ub͕u a, nēzu-kwa-nu ike: le, oge hour nkem di nso, anārara Nwa nke madu nye n'aka ndi-nmehie. Bilienu, ka ayi je: le, onye nāraram nye nọ nso. Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, le, Judas, otù onye n'etiti ndi-ozi iri na abua ahu, we bia, ya na oké ìgwè madu ndi chiri mma-agha na osisi, site n'ebe ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nke ndi-Ju nọ. Ma onye nārara Ya nye nyere ha ihe-iriba-ama, si, Onye ọ bula m'gēsutu ọnu, Onye ahu bu Ya: jidenu Ya. Ngwa ngwa ọ biakutere Jisus, si, Ekele, Rabai; o we sutu Ya ọnu nke-uku. Jisus we si ya, Eyim, me ihe i biara ime. Mb͕e ahu ha biakutere Ya, we tukwasi Jisus aka, jide Ya. Ma le, otù onye nime ndi ha na Jisus nọ setiri aka-ya, miputa mma-agha-ya, b͕u orù onye-isi-nchu-aja mma, bipu nti-ya. Mb͕e ahu Jisus si ya, Mighachi mma-agha-gi n'ọnọdu-ya: n'ihi na madu nile ndi were mma-agha gāla n'iyì site na mma-agha. Ma-ọbu i nēchè na apughm iriọ Nnam, Ọ gēzite-kwa-ram ọbuná ub͕u a kari legion iri na abua nime ndi-mọ-ozi? Ihe edeworo n'akwukwọ nsọ gēsi kwa aṅa mezu, na ọ ghaghi ime otú a? N'oge hour ahu Jisus siri ìgwè madu ahu, Ùnu putara chiri mma-agha na osisi ijidem, dika imegide onye nāpunara madu ihe? Kwa-ubọchi M'nọduru n'ulo uku Chineke nēzí ihe, ma unu ejideghm. Ma emewo ihe a dum, ka ihe nile ndi-amuma dere n'akwukwọ we mezu. Mb͕e ahu ndi nile nēso uzọ-Ya rapuru Ya, b͕alaga. Ma ndi jidere Jisus si n'ebe ahu duru Ya je rue ulo Kaiafas onye-isi-nchu-àjà, ebe ndi-ode-akwukwọ na ndi-okenye zukọrọ. Ma Pita soro Ya n'ebe di anya, rue obí onye-isi-nchu-àjà, o we ba nime, nọdu n'etiti ndi nēje ozi, ka ọ hu ọgwugwu-ya. Ma ndi-isi-nchu-àjà na nnọkọ-ikpé dum nāchọ àmà ugha imegide Jisus, ka ha we me ka Ọ nwua; ma ha achọtaghi, ọ bu ezie na ọtutu ndi-àmà ugha biara. Ma emesia abua biara, si, Nwoke a siri, Apurum ikwatu ulo nsọ a nke Chineke, wu kwa ya n'ubọchi atọ. Onye-isi-nchu-àjà we bilie, si Ya, Ì zaghi ihe ọ bula? gini bu àmà madu ndia nāb͕agide Gi? Ma Jisus kpuchiri ọnu. Onye-isi-nchu-àjà we si Ya, Ewerem Chineke di ndu b͕a Gi iyí, ka I gwa ayi ma Gi onwe-gi bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke. Jisus si ya, Gi onwe-gi kwuru: otú ọ di, asim unu, Site n'ub͕u a unu gāhu Nwa nke madu ka Ọ nānọdu n'aka-nri nke ike, nābia kwa n'elu igwe-oji nile nke elu-igwe. Mb͕e ahu onye-isi-nchu-àjà dọwara uwe-ya nile, si, O kwuluru Chineke: ọ̀ bu nkpà ndi-àmà gini nākpa ayi ọzọ? le, ub͕u a ka unu nuru nkwulu ahu: gini bu uche-unu? Ha we za, si, O kwesiri inwu ọnwu. Mb͕e ahu ha busara Ya ọnu-miri n'iru, ti kwa Ya aka: ufọdu we pia Ya ihe, si, Buru ayi amuma, Kraist: ònye bu onye ahu nke tiri Gi aka? Ma Pita nọduru n'èzí n'obí: otù nwa-ab͕ọghọ we biakute ya, si, Gi onwe-gi na Jisus Onye Galili nọ-kwa-ra. Ma ọ gọrọ n'iru ha nile, si, Amataghm ihe i nēkwu. Ma mb͕e ọ puru je n'uzọ-nbata, nwa-ab͕ọghọ ọzọ huru ya, ọ si ndi nọ n'ebe ahu, Nwoke a na Jisus Onye Nazaret nọ-kwa-ra. O were iṅu-iyí gọ kwa ọzọ, si, Amataghm Nwoke a. Ma mb͕e nwa oge gasiri ndi guzoro nso biakutere Pita, si ya, N'ezie gi onwe-gi bu kwa otù onye nime ha; n'ihi na okwu-ọnu-gi nēweputa gi n'ìhè. Mb͕e ahu ọ malitere idu ikwù na iṅu iyí, si, Amataghm Nwoke a. Ngwa ngwa oke-ọkuku we kwa ákwá. Pita we cheta okwu Jisus kwururi, si, Mb͕e oke-ọkuku akākwaghi, i gāgọnarim ub͕ò atọ. O we pua, kwa ákwá nke-uku.

Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara MATIU 26:36-75