Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 26:1-16

MATIU 26:1-16 IGBOB

O rue, mb͕e Jisus kwubìri okwu ndia nile, Ọ si ndi nēso uzọ-Ya, Unu matara na mb͕e ubọchi abua gasiri ememe ngabiga nābia, arara kwa Nwa nke madu nye ka akpọgide Ya n'obe. Mb͕e ahu ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nke ndi-Ju zukọrọ n'obí onye-isi-nchu-àjà, onye anākpọ Kaiafas; ha we b͕akọ ìzù ka ha we were aghughọ jide Jisus, b͕ue Ya. Ma ha siri, Ọ bughi n'ememe a, ka ùzù we ghara iputa n'etiti ndi-Ju. Ma mb͕e Jisus nọ na Betani, n'ulo Saimon onye-ekpenta, otù nwanyi biakutere Ya nke nēji ite alabaster, nke manu-otite di oké ọnu-ahia nke-uku di ya, o we wusa manu-otite ahu n'isi-Ya, mb͕e Ọ nọduru na nri. Ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya huru ya, iwe were ha nke-uku, ha si, Èji ila-n'iyì nka me gini? N'ihi na apuru ire manu-otite a oké ọnu-ahia, we nye ndi-ob͕eye. Ma mb͕e Jisus mara ya, Ọ si ha, Gini mere unu nēsob͕u nwanyi a? n'ihi na ọ luru ọlu ọma n'arum. N'ihi na unu nwere ndi-ob͕eye n'etiti unu mb͕e nile; ma unu enweghi Mu onwem mb͕e nile. N'ihi na n'iwusi manu-otite a n'arum, o mere ya ka o we doziem n'olìlì. N'ezie asim unu, Ebe ọ bula agēkwusa ozi ọma nka n'uwa dum, agēkwuta kwa ihe nke nwanyi a mere, ka ọ buru ihe-ncheta-ya. Mb͕e ahu otù onye nime ndi-ozi iri na abua ahu, onye anākpọ Judas Iskariot, jekuru ndi-isi-nchu-àjà, si, Gini ka unu nāchọ inyem, mu onwem gārara kwa Ya nye n'aka-unu? Ha we tù orú ego ọla-ọcha na iri nye ya. Site na mb͕e ahu o we chọ oghere irara Ya nye.