Mb͕e ahu agēji ala-eze elu-igwe tuyere umu-ab͕ọghọ iri, ndi chiri ọwa-ha, pua izute onye nālu nwunye ọhu. Ma ise nime ha bu ndi-nzuzu, ise bu kwa ndi nwere uche. N'ihi na ndi-nzuzu ahu, mb͕e ha chiri ọwa-ha, ha ejighi manu n'aka-ha: ma ndi ahu nwere uche ji manu n'aria-ha tiyere ọwa-ha. Ma mb͕e onye nālu nwunye ọhu nānọ ọdù di anya, ha nile rubere ura we raru. Ma n'etiti abali iti-nkpu dara, Le, onye nālu nwunye ọhu! Putanu izute ya. Mb͕e ahu umu-ab͕ọghọ ahu nile biliri, we dozie ọwa-ha. Ndi-nzuzu we si ndi nwere uche, Nye ayi ufọdu na manu-unu; n'ihi na ọwa-ayi nānyu anyu. Ma ndi nwere uche zara, si, É-è, eleghi anya ọ gaghi-ezuru ayi na unu: kama jekurunu ndi nēre, zuru nye onwe-unu. Ma mb͕e ha nēje izú, onye nālu nwunye ọhu biara; ndi edoziworo we so ya ba n'oriri ọlulu-nwunye: ewe mechie uzọ. Emesia umu-ab͕ọghọ fọduru bia kwa, nāsi, Onye-nwe-ayi, Onye-nwe-ayi, meghere ayi uzọ. Ma ọ zara, si, N'ezie asim unu, amataghm unu. Ya mere, nēchenu nche, n'ihi na unu amataghi ubọchi ahu ma-ọbu oge hour ahu.
Gụọ MATIU 25
Geere nke a ntị MATIU 25
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MATIU 25:1-13
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị