Ma ndi-Farisi, mb͕e ha nuru na O mereri ka ndi-Sadusi kpuchie ọnu-ha, ha zukọrọ n'otù ebe. Otù onye n'etiti ha, bú onye-iwu, we jua Ya ajuju, nānwa Ya, si, Onye-ozizí, òle ihe di uku nke enyere n'iwu nime iwu-ayi? Ọ si ya, I gēwere obi-gi dum, were kwa nkpuru-obi-gi dum, were kwa uche-gi dum, hu Onye-nwe-ayi Chineke-gi n'anya. Nka bu ihe uku na ihe mbu enyere n'iwu. Ihe nke-abua nke yiri ya bu nka, I gāhu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi. Iwu dum, na ndi-amuma Chineke, nēkokwasi n'ihe abua ndia enyere n'iwu.
Ma mb͕e ndi-Farisi zukọsiri, Jisus juru ha, si, Gini bu uche-unu bayere Kraist ahu? Nwà onye ka Ọ bu? Ha si Ya, Nwa Devid. Ọ si ha, Dèvid si kwa aṅa kpọ Ya Onye-nwe-ya nime Mọ Nsọ, si,
Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem,
Nọdu ala n'aka-nrim,
Rue mb͕e M'gētiye ndi-iro-Gi n'okpuru ukwu-Gi abua?
Ya mere, ọ buru na Devid akpọ Ya Onye-nwe-ya, Ò si aṅa buru Nwa-ya? Ma ọ dighi onye ọ bula puru iza Ya okwu, ọ dighi kwa onye nwere anya-ike site n'ubọchi ahu iju Ya ajuju ọzọ.