Ma mb͕e amuru Jisus na Betlehem nke Judia n'ubọchi Herod, bú eze, le, ufọdu ndi mara ihe, ndi sitere n'Ọwuwa-anyanwu, biaruru Jerusalem, si, Òle ebe Ọ nọ, bú Onye amuru ibu Eze ndi-Ju? n'ihi na ayi huru kpakpando-Ya n'Ọwuwa-anyanwu, ayi we bia ikpọ isi ala nye Ya. Ma mb͕e Herod, bú eze, nuru, obi lọrọ ya miri, ya na Jerusalem nile. O we me ka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ nile nke ndi-Ju zukọ, o we jua n'ọnu-ha ebe agāmu Kraist nke ha. Ha we si ya, Na Betlehem nke Judia: n'ihi na otú a ka edeworo ya n'akwukwọ site n'aka onye-amuma, si,
Gi Betlehem kwa, ala Juda,
I dighi nke-ntà kachasia n'etiti ndi-isi Juda ma-ọli:
N'ihi na n'etiti gi ka Onye-isi gāputa,
Onye gāzù ndi nkem Israel dika aturu.
Mb͕e ahu Herod kpọrọ ha na nzuzo, bú ndi ahu mara ihe, o we juta nke-ọma n'ọnu-ha oge kpakpando ahu nke nāputa ìhè. O we zìe ha je Betlehem, si, Ganu chọputa nke-ọma okwu bayere Nwatakiri ahu; ma mb͕e ọ bula unu gāchọta Ya, bia kọrọm, ka mu onwem we je kwa kpọ isi ala nye Ya. Mb͕e ha nuru okwu eze ahu, ha we ga; ma le, kpakpando ahu, nke ha huru n'Ọwuwa-anyanwu, ọ nāga n'iru ha, rue mb͕e ọ biara guzo n'elu ebe Nwatakiri ahu nọ. Mb͕e ha huru kpakpando ahu ha we ṅuria oké ọṅù nke-uku. Ha we ba nime ulo, hu Nwatakiri ahu, Ya na Meri nne-Ya; ha we da n'ala kpọ isi ala nye Ya; ha we kpughe ib͕e àkù ha, che onyinye n'iru Ya, ọla-edo na frankincense na myrrh. Ebe Chineke duru ha ọdú na nrọ ka ha ghara ilaghachi jekuru Herod, ha we wezuga onwe-ha ga ala-ha site n'uzọ ọzọ.
Ma mb͕e ha wezugasiri onwe-ha, le, mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi were onwe-ya gosi Josef na nrọ, si, Bilie, kuru Nwatakiri ahu na nne-Ya b͕alaga n'Ijipt, nọ n'ebe ahu rue mb͕e ọ bula m'gāgwa gi: n'ihi na Herod gaje ichọ Nwatakiri ahu ka ọ la Ya n'iyì. O we bilie, kuru Nwatakiri ahu na nne-Ya n'abali, wezuga onwe-ya ga Ijipt; O we nọ n'ebe ahu rue ọnwu Herod: ka okwu Onye-nwe-ayi kwuru site n'ọnu onye-amuma-Ya we mezu, si, Site n'Ijipt ka M'kpọputara Nwam. Mb͕e ahu Herod, mb͕e ọ huru na ndi ahu nke mara ihe mere ya ihe-ọchì, ọnuma di ya n'obi nke-uku, o we ziga, b͕uchasia umuaka-ndikom nile di na Betlehem, na n'ókè-ala-ya nile, site na ndi b͕ara arọ abua we rida, dika oge ahu nke ọ jutara nke-ọma n'ọnu ndi ahu mara ihe. Mb͕e ahu ka emezuru okwu ekwuru site n'ọnu Jeremaia onye-amuma, si,
Anuru olu na Rema,
Ikwa-ákwá na iru-újú uku,
Rechel nākwara umu-ya ákwá;
Ọ chọghi kwa ka akasie ya obi, n'ihi na ha adighi.