Mb͕e ahu Ọ rapuru ìgwè madu nile, we bà n'ulo-ha: ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, si, Kọrọ ayi isi ilu ata di n'ubi ahu. O we za, si, Onye nāgha nkpuru ọma ahu bu Nwa nke madu; ubi ahu bu uwa; nkpuru ọma ahu, ndi ahu bu umu ala-eze elu-igwe; ata ahu bu umu ajọ onye ahu; onye-iro ahu nke ghara ha bu ekwensu: owuwe-ihe-ubi bu ọgwugwu oge a; ndi ahu nēwe ihe-ubi bu ndi-mọ-ozi. Ya mere dika anāchikọputa ata rechapu kwa ha n'ọku; otú a ka ọ gādi n'ọgwugwu oge a. Nwa nke madu gēzipu ndi-mọ-ozi-Ya, ha gāchikọputa n'ala-eze-Ya ihe nile nēme ka ama n'ọnyà, na ndi nēme ihe nēmebi iwu, ha gātubà kwa ha n'oké ọku ahu: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi. Mb͕e ahu ka ndi ezi omume gēnwupu dika anyanwu n'ala-eze nke Nna-ha. Onye nwere nti, ya nu. Ala-eze elu-igwe yiri àkù ezoworo n'ubi; nke madu huru, zobe kwa; n'ọṅù-ya o we la, re ihe nile o nwere, ka ha ra, we zuta ubi ahu. Ọzọ kwa, ala-eze elu-igwe yiri onye-ahia nāchọ pearl ọma: ma mb͕e ọ huru otù pearl di oké ọnu-ahia, ọ je, re ihe nile o nwere, ka ha ra, we zuta ya.
Gụọ MATIU 13
Geere nke a ntị MATIU 13
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MATIU 13:36-46
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo