Ma ọ buru na unu marari ihe okwu a bu, Anamachọ ebere, ọ bughi àjà, unu agaghi-ekpeb͕u ndi adighi-ata ha uta. N'ihi na Nwa nke madu bu Onye-nwe ubọchi-izu-ike.
O we si n'ebe ahu pua, ba n'ulo-nzukọ-ha: ma le, otù nwoke nke nwere aka kpọnwuru akpọnwu. Ha we jua Ya, si, Ò ziri ezi n'iwu ime ka aru madu di ike n'ubọchi-izu-ike? ka ha we bo Ya ebubo. ma Ọ siri ha, Òle madu gādi n'etiti unu, nke gēnwe otù aturu, ma ọ buru na aturu ahu adabà nime olùlù n'ubọchi-izu-ike, ọ̀ gaghi-ejide ya, dọgoputa ya? Òle kwa ka ọ ra, bú otú ọnu-ahia madu kariri nke aturu oké ọnu! Ya mere o ziri ezi n'iwu ime ihe ọma n'ubọchi-izu-ike. Mb͕e ahu Ọ si nwoke ahu, Setipu aka-gi. O we setipu ya; ewe me ka aka-ya di nma, dika nke-ọzọ. Ndi-Farisi we pua, b͕a izù imegide Ya, ka ha gēsi la Ya n'iyì. Ma ebe Jisus mara ya, O si n'ebe ahu wezuga Onwe-ya: ọtutu madu we so Ya; O we me ka aru di ha nile ike, O we dọ ha aka na nti ka ha ghara ime ka Ọ puta ìhè: ka okwu ekwuru site n'ọnu Aisaia onye-amuma we mezu, si,
Le, Onye nējerem ozi Onye M'rọputara;
Onye M'huru n'anya, Onye ihe-Ya di nkpuru-obim ezi nma:
M'gātukwasi Ya Mọ nkem,
Ọ gākọ-kwa-ra mba nile akukọ ikpé.
Ọ gaghi-alu ọ̀gù, Ọ gaghi-etisi kwa nkpu ike;
Ọ dighi kwa onye ọ bula gānu olu-Ya n'amá.
Ọ gaghi-akpaji ami apiara apia,
Ọ gaghi-emenyu kwa ogho-oriọna nākwu anwuru-ọku,
Rue mb͕e Ọ gātupu ikpé-Ya rue na nmeri.
Ọ bu kwa n'aha-Ya ka mba nile gātukwasi obi.