N'oge ahu Jisus zara, si, Ekelem I, Nna, Onye-nwe elu-igwe na uwa, na I zonariri ndi-amam-ihe na ndi nwere nghọta ihe ndia, I were kwa ha kpughere umu ọhu: e, Nna, ekelem I na ọ di ezi nma otú a n'iru Gi. Nnam rara ihe nile nyem n'aka: ọ dighi kwa onye ọ bula mazuru Ọkpara ahu, ma-ọbughi Nna-Ya; ọ dighi kwa onye mazuru Nna ahu, ma-ọbughi Ọkpara-Ya, na onye ọ bula Ọkpara nēzube ikpughe Ya nye ya. Biakutenum, unu nile ndi nādọb͕u onwe-unu n'ọlu, ndi ebowo-kwa-ra ibu di arọ́, Mu onwem gēme kwa ka unu zuru ike. Nyaranu yoke nkem n'olu-unu, muta-kwa-nu ihe n'ọnum; n'ihi na abum Onye nwayọ na Onye wedatara Onwe-ya ala n'obi: unu gāhu kwa izu-ike nye nkpuru-obi-unu. N'ihi na yoke nkem adighi-eb͕u nb͕u, ibum di kwa nfé.
Gụọ MATIU 11
Geere nke a ntị MATIU 11
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MATIU 11:25-30
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị