Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 11:16-30

MATIU 11:16-30 IGBOB

Ma M'gēji ọb͕ọ a tuyere gini? O yiri umu-ntakiri ndi nānọdu n'ọma-ahia, ndi nākpọ ibe-ha òkù, si, Ayi b͕uru unu ọ̀jà, ma unu eteghi egwú; ayi kwara ákwá, ma unu etighi aka n'obi. N'ihi na Jọn biara nērighi ihe-oriri nāṅughi kwa ihe-ọṅuṅu, ha we si, O nwere mọ ọjọ. Nwa nke madu biara nēri ihe-oriri nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ha we si, Le, onye-ori-nke-uku, na onye-oké-ọṅu-manya, eyì ndi-ọna-utu na ndi-nmehie! Agu-kwa-ra amam-ihe n'onye ezi omume site n'ọlu-ya nile. Mb͕e ahu ka Ọ malitere ita obodo ahu uta, bú nke Ọ lukariri ọlu-Ya di ike nime ha, n'ihi na ha echègharighi. Ahuhu gādiri gi, Korazin; ahuhu gādiri gi, Betsaida; n'ihi na asi na alururi ọlu nile di ike na Taia na Saidon nke aluru nime unu, ha gēchèghariwori n'oge di anya gara aga n'ákwà-nkpe na ntu. Otú ọ di, asim unu, Taia na Saidon gānagide okwu n'ubọchi ikpé, kari unu. Gi onwe-gi kwa, Kapanaum, àgēweli gi rue elu-igwe? i gārida rue Hedis: n'ihi na asi na alururi ọlu nile di ike na Sọdọm nke aluru nime gi, ọ gānọgidewori rue ta. Otú ọ di, asim unu, na ala Sọdọm gānagide okwu n'ubọchi ikpé kari gi. N'oge ahu Jisus zara, si, Ekelem I, Nna, Onye-nwe elu-igwe na uwa, na I zonariri ndi-amam-ihe na ndi nwere nghọta ihe ndia, I were kwa ha kpughere umu ọhu: e, Nna, ekelem I na ọ di ezi nma otú a n'iru Gi. Nnam rara ihe nile nyem n'aka: ọ dighi kwa onye ọ bula mazuru Ọkpara ahu, ma-ọbughi Nna-Ya; ọ dighi kwa onye mazuru Nna ahu, ma-ọbughi Ọkpara-Ya, na onye ọ bula Ọkpara nēzube ikpughe Ya nye ya. Biakutenum, unu nile ndi nādọb͕u onwe-unu n'ọlu, ndi ebowo-kwa-ra ibu di arọ́, Mu onwem gēme kwa ka unu zuru ike. Nyaranu yoke nkem n'olu-unu, muta-kwa-nu ihe n'ọnum; n'ihi na abum Onye nwayọ na Onye wedatara Onwe-ya ala n'obi: unu gāhu kwa izu-ike nye nkpuru-obi-unu. N'ihi na yoke nkem adighi-eb͕u nb͕u, ibum di kwa nfé.