O rue, mb͕e ubọchi nēzu okè mb͕e agānara Ya n'elu, na Ya onwe-ya che iru-Ya si-ike iga Jerusalem, O we zipu ndi-ozi n'iru Ya: ha we ga, ba n'otù obodo ntà nke ndi Sameria, ka ha doziere Ya. Ma ha anaraghi Ya nke-ọma, n'ihi na iru-Ya di ka Ọ nāga Jerusalem. Ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya, bú Jemes na Jọn, huru nka, ha si, Onye-nwe-ayi, Ì nāchọ ka ayi si ọku site n'elu-igwe da, rechapu ha? O we chigharia, bara ha nba, si, Unu amataghi aha mọ di nime unu. N'ihi na Nwa nke madu abiaghi ila ndu madu n'iyì, kama ka o we zọputa ha. Ha we pua ga n'obodo ntà ọzọ.
Gụọ LUK 9
Geere nke a ntị LUK 9
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: LUK 9:51-56
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị