O we rue mb͕e ubọchi asatọ gasiri mb͕e O kwusiri okwu ndia, na Ọ chiri Pita na Jọn na Jemes tiyere Onwe-ya, rigo n'ugwu ahu ikpe ekpere. Mb͕e Ọ nēkpe ekpere, oyiyi iru-Ya we di iche, uwe-Ya we nācha ucha nēb͕u kwa dika àmùma. Ma le, Ya na ndikom abua nēkwurita okwu, ndi bu Moses na Elaija; ndi emere ka ahu ha anya n'ebube, ndi nēkwu kwa okwu bayere ọlila-Ya, nke Ọ gaje imezu na Jerusalem. Ma ura jururi Pita na ndi ya na ha nọ n'anya: ma mb͕e ha tetara nke-ọma, ha hu ebube-Ya, na ndikom abua ahu Ya na ha guzoro. O we rue, mb͕e ha si n'ebe Ọ nọ nēkewapu, Pita si Jisus, Nna-ayi, ọ di nma ka ayi nọ n'ebe a: ka ayi ma kwa ulo-ikwū atọ; ka otù diri Gi, ka otù di-kwa-ra Moses, ka otù di-kwa-ra Eliaja: n'ihi na ọ mataghi ihe ọ nēkwu. Mb͕e ọ nēkwu okwu ndia, igwe-oji we bia, kpuchie ha: ha we tua egwu mb͕e ha nābà n'igwe-oji ahu. Olu we si n'igwe-oji ahu puta, si, Onye a bu Ọkparam, Onye M'rọputara: nurunu okwu-Ya. Mb͕e olu ahu putasiri, ahuru nání Jisus. Ndi ahu we kpuchie ọnu-ha, ha akọghi kwa akukọ ihe ọ bula ha hururi nye onye ọ bula na mb͕e ahu.
O rue, n'ubọchi so ya, mb͕e ha siri n'ugwu ahu rida, na oké ìgwè madu zutere Ya. Ma le, otù nwoke si n'ìgwè madu ahu ti nkpu, si, Onye-ozizí, ariọm Gi ka I le nwam nwoke anya; n'ihi na ọ bu nwam m'muru nání ya: le kwa, ajọ mọ nējide ya, o we nēti nkpu na mberede; ajọ mọ ahu nēse kwa ya, me ka ọ nāsu ufufu n'ọnu, o ji kwa ike arapu ya, nēchihia ya aru nke-uku. M'we riọ ndi nēso uzọ-Gi ka ha chupu ya; ma ha apughi. Jisus we za, si, Unu ọb͕ọ nēnweghi okwukwe, nke nwe-kwa-ra anya-ùhìe, rùe ole mb͕e ka Mu na unu gānọ, ewem nagide kwa unu? kuta nwa-gi n'ebe a. Mb͕e ọ nọ nābiakute Ya, mọ ọjọ ahu we tuda ya n'ala, sesie ya ike. Ma Jisus bara mọ ahu nādighi ọcha nba, we me ka aru nwa-okoro ahu di ike, O we kuru ya nyeghachi nna-ya. Ma ibobo idi-uku nke Chineke nwuru ha nile n'aru.
Ma mb͕e ihe nile Ọ nēme nēju madu nile anya, Ọ si ndi nēso uzọ-Ya, Unu onwe-unu debe okwu ndia na nti-unu: n'ihi na agaje irara Nwa nke madu nye n'aka madu. Ma ha aghọtaghi okwu a, ọ bu kwa ihe ezonariwori ha, ka ha ghara inuta ya: ha nātu kwa egwu iju Ya ajuju bayere okwu a.
Iru-uka we da n'etiti ha, onye gāka ibe-ya uku n'etiti ha. Ma mb͕e Jisus huru iru-uka nke di n'obi-ha, O jide nwatakiri n'aka, debe ya n'akuku Ya, we si ha, Onye ọ bula nke gānara nwatakiri a nke-ọma n'aham, ọ bu Mu onwem ka ọ nānara nke-ọma: onye ọ bula nke nānara kwa Mu nke-ọma nānara Onye ziputaram nke-ọma: n'ihi na onye dikari ntà n'etiti unu nile, onye ahu bu onye uku.
Jọn we za, si, Nna-ayi, ayi huru otù onye ka ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ n'aha-Gi; ayi we b͕ochie ya, n'ihi na ọ dighi-eso ayi. Ma Jisus siri ya, Unu eb͕ochila ya: n'ihi na onye nādighi-emegide unu diri unu.