Ma mb͕e ìgwè madu nile mara ya, ha soro Ya: O we nara ha nke-ọma, we gwa ha okwu bayere ala-eze Chineke, nēme kwa ka aru di ha ike, bú ndi ọ di nkpà ka eme ka aru-ha di ike. Ma chi malitere iji; ndi-ozi iri na abua ahu we biakute Ya, si Ya, Zilaga ìgwè madu a, ka ha we ga n'obodo ntà nile na ubi nile di buruburu, nọ ọnọdu-abali, chọta kwa ihe ha gēri; n'ihi na ayi nọ n'ebe a nime ọhia. Ma Ọ siri ha, Unu onwe-unu nye ha ihe ka ha rie. Ha we si, Ayi enweghi kari ob͕e achicha ise na azù abua; ma-ọbughi na ayi onwe-ayi gāga zuta nri nye ndi nka nile. N'ihi na ha ra ka nnù ndikom iri na nnù abua na ọgu iri. O we si ndi nēso uzọ-Ya, Menu ka ha nọdu ala n'òtù di iche iche, ihe dika ọgu madu abua na iri n'otù òtù. Ha we me otú ahu, me ka ha nile nọdu ala. O we nara ob͕e achicha ise na azù abua ahu, le anya n'elu-igwe, gọzie ha, nyawa; O we nēnye ndi nēso uzọ-Ya ka ha debe ha n'iru ìgwè madu ahu. Ha we rie, afọ ju-kwa-ra ha nile: ewe tutukọ iberibe fọduru ha, nkata iri na abua.
Gụọ LUK 9
Geere nke a ntị LUK 9
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: LUK 9:11-17
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị