Ma mb͕e Jisus laghachiri, ìgwè madu ahu nara Ya nke-ọma; n'ihi na ha nile nēle anya Ya. Ma le, otù nwoke, aha-ya bu Jeairọs, biara, ya onwe-ya bu kwa onye-isi ulo-nzukọ: o we da n'ala n'ukwu Jisus, we riọ Ya ka Ọ bia n'ulo-ya; n'ihi na o nwere nwa-nwanyi ọ muru nání ya, nke b͕ara ihe ra ka arọ iri na abua, nwata ahu nānwu kwa anwu. Ma mb͕e Ọ nēje ìgwè madu nile nākpab͕u Ya. Otù nwanyi nke nwere orùrù-ọbara arọ iri na abua, nke mefusiri ihe dum o ji biri n'aru ndi-dibia, ma ọ dighi onye ọ bula nwere ike ime ka aru-ya di ike, nwanyi ahu we bia n'azu Ya, we metu ọnu-ọnu uwe-Ya aka: ngwa ngwa orùrù-ọbara-ya we guzo. Jisus we si, Ònye bu onye ahu nke meturum aka? Ma mb͕e madu nile di nāgo, Pita na ndi ya na ha yikọ si, Nna-ayi, ìgwè madu ndia nādagide Gi nākpab͕u kwa Gi. Ma Jisus siri, Madu meturum aka: n'ihi na Mu onwem mara na ike esiwori n'arum puta. Ma mb͕e nwanyi ahu huru na o zoghi ezo, o were ima-aru-jijiji bia, we da n'iru Ya, kọ n'iru ndi-Ju ahu nile ihe mere o ji metu Ya aka, na otú esi me ka aru di ya ike ngwa ngwa. Ma Ọ siri ya, Nwam nwanyi, okwukwe-gi azọputawo gi; la n'udo.
Gụọ LUK 8
Geere nke a ntị LUK 8
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: LUK 8:40-48
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị