Ha we rue ala ndi Gerasa, nke di na ncherita-iru Galili. Ma mb͕e O siri n'ub͕ọ puta rigo n'ala, otù nwoke nke si n'obodo ahu puta zutere ya, bú onye nwere ndi-mọ ọjọ; ma na mb͕e di anya ọ dighi uwe o yiri, o bighi kwa n'ulo, kama n'ebe anēlì ozu. Ma mb͕e ọ huru Jisus, o tisie nkpu ike, da kwa n'ala n'iru Ya, were oké olu si, Gini ka mu na Gi nwekọrọ, Jisus, Ọkpara Chineke Nke kachasi ihe nile elu? ariọm Gi, emekpalam aru. N'ihi na O nyere mọ ahu nādighi ọcha iwu ka o si nime nwoke ahu puta. N'ihi na ọtutu mb͕e ka ọ nējisi ya ike: anēche kwa ya nche, ewere kwa nkpọrọ na nkpọrọ-ukwu ke ya; o we nyajipu ihe eji ke ya, mọ ọjọ ahu we churu ya ba n'ọhia. Jisus we jua ya, si, Òle aha-gi? Ọ si, Legion; n'ihi na ọtutu ndi-mọ ọjọ bàra nime ya. Ha we riọ Ya ka ọ ghara inye ha iwu ka ha je ba n'abyss. Ma ìgwè ọtutu ezì di n'ebe ahu nāta nri n'ugwu: ha we riọ Ya ka O kwere ha ka ha ba nime ha. O we kwere ha. Ndi-mọ ọjọ ahu we si nime nwoke ahu puta, ba nime ìgwè ezì ahu: ìgwè ezi ahu we nuda n'ebe ahu di nkputankpu dabà n'ọdọ-miri, miri we b͕ab͕ue ha. Ma mb͕e ndi nāzù ha huru ihe emereri, ha b͕alaga, kọsa ya n'obodo ahu na gburugburu ya nile.
Gụọ LUK 8
Geere nke a ntị LUK 8
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: LUK 8:26-34
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị