Mb͕e O chigharisiri n'ebe nwanyi ahu nọ, Ọ si Saimon, Ì huru nwanyi a? Abataram n'ulo-gi, i nyeghi m miri iji sa ukwu: ma nwanyi a were anya-miri-ya desa ukwum, were kwa agiri-isi-ya hicha ha. I sutughm ọnu: ma nwanyi a, site na mb͕e M'batara, ọ rapughi isutu ukwum ọnu nke-uku. I weghi manu tem n'isi: ma nwanyi a were manu-otite tem n'ukwu. N'ihi nka asim i, Ab͕agharaworo ya nmehie-ya, nke di ọtutu; n'ihi na ọ hurum n'anya nke-uku: ma onye ab͕aghara ihe ntà, onye ahu nāhu n'anya nke-ntà. O we si nwayi ahu, Ab͕agharaworo gi nmehie nile gi. Ndi ha na Ya nọduru na nri we malite isirita onwe-ha, Ònye bu Onye a, Nke nāb͕aghara kwa nmehie? O we si nwanyi ahu, Okwukwe-gi azọputawo gi; la n'udo.
Gụọ LUK 7
Geere nke a ntị LUK 7
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: LUK 7:44-50
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị