Ndi nēso uzọ Jọn we kọrọ ya akukọ bayere ihe ndia nile. Jọn we kpọ madu abua biakute ya nime ndi nēso uzọ-ya, zigara Onye-nwe-ayi, si, Gì onwe-gi bu Onye nābia, ma-ọbu na ayi nēle anya onye ọzọ? Ma mb͕e ndikom ahu biakutere Ya, ha si, Jọn Baptist ezìwo ayi biakute Gi, si, Gì onwe-gi bu Onye nābia, ma-ọbu na ayi nēle anya onye ọzọ? N'oge hour ahu O mere ka aru ọtutu madu di ike site n'ọria na ajọ ọria di iche iche na ndi ajọ mọ; O were kwa amara me ka ọtutu ndi-ìsì hu uzọ. O we za, si ha, Ganu, kọrọ Jọn ihe nile unu huru na nke unu nuru; ndi-ìsì nāhu uzọ, ndi- ngwurọ nēje ije, anēme ndi-ekpenta ka ha di ọcha, ndi nti chiri nānu ihe, anēme ndi nwuru anwu ka ha si n'ọnwu bilie, anēzì ndi-ob͕eye ozi ọma. Ngọzi nādikwara onye ahu, bú onye ọ bula nke nāgaghi-ama n'ọnyà n'arum.
Gụọ LUK 7
Geere nke a ntị LUK 7
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: LUK 7:18-23
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo