O rue na Ọ nāga n'etiti ubi ọka n'ubọchi-izu-ike; ndi nēso uzọ-Ya we nāghọ oko ọka, nāta, nāmazu ha n'aka-ha. Ma ufọdu nime ndi-Farisi siri, Gini mere unu nēme ihe nēzighi ezi n'iwu ime n'ubọchi-izu-ike? Jisus we za ha, si, Ùnu agughi ọbuná ihe a, nke Devid mere, mb͕e agu guru ya, ya onwe-ya na ndi soro ya; otú ọ batara n'ulo Chineke, were kwa ob͕e achicha anēche n'iru Chineke rie ya, o we nye kwa ndi ya na ha yikọ; nke nēzighi ezi n'iwu ka ha rie, ma nání ndi-nchu-àjà ka o ziri ezi? O we si ha, Nwa nke madu bu Onye-nwe ubọchi-izu-ike. O we rue n'ubọchi-izu-ike di iche, na Ọ batara n'ulo-nzukọ-ha, we nēzí ihe: otù nwoke nọ kwa n'ebe ahu, aka-nri-ya kpọnwu-kwa-ra akpọnwu. Ma ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi nēche Ya, ma Ọ gēme ka aru-ya di ike n'ubọchi-izu-ike; ka ha we hu ihe ha gēji bo Ya ebubo. Ma Ya onwe-ya matara ihe ha nātule n'obi; O we si nwoke ahu aka-ya kpọnwuru akpọnwu, Bilie, guzo n'etiti. O we bilie, guzo kwa. Jisus we si ha, Anamaju unu, Ò ziri ezi n'iwu ime ezi ihe, ma-ọbu ime ihe ọjọ, n'ubọchi-izu-ike? ìzọ̀puta ndu, ma-ọbu ila ya n'iyì? Mb͕e Ọ lesiri ha nile anya gburugburu, O we si ya, Setipu aka-gi. O we me ya: ewe me ka aka-ya di ka ọ di na mbu. Ma ndi ahu juputara n'enweghi-uche; ha we nēkwurita n'etiti onwe-ha ihe ha gēme Jisus.
Gụọ LUK 6
Geere nke a ntị LUK 6
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: LUK 6:1-11
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo